Gọvanọ Obiano emeela onye Igala kọmishọna n'Anambara

Bonaventure Enemali Image copyright Anambra Igala Youth Council
Nkenke aha onyonyo Bonaventure Enemali bụ onye abụọ pekarịchara mpe n'afọ ga-abụ kọmishọna n'Anambara steeti

Bonaventure Enemali bụ onye Igala, ga-anọchite anya ndị Anambra West n'ọkwa kọmishọna.

Enemali so na kọmishọna 19 Gọvanọ Obiano duru iyi ọrụ n'Awka ụnyaahụ.

Obiano mere ya kọmishọna ga-ahụ maka ọganiihu ndị ntoorobịa nke bekee kpọrọ youth empowerment and creative economy.

Ọkwa ọhụrụ ya mere ka Enemali dị afọ 33 bụrụ onye abụọ pekarịchara mpe n'afọ ga-abụ kọmishọna n'Anambra steeti, ebe onye nke ọzọ bụ Mark Okoye bụ kọmishọna nke Budget and Economic Planning dị afọ 31.

Cheta na enwere ndị Igala na Kogi steeti, Anambara steeti nakwa Enugwu steeti.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ị na-amaghị gbasara Enemali

  • Enemali gụrụ Business Administration na mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu dị na Uli.
  • N'agbanyeghị na ọ dị afọ 33, Enemali alụọla nwaanyị ma nwee ụmụ abụọ.
  • O ruola afọ iri o biri na Legọs, mana ọ kwaghachịrị Anambara maka ịrụ ọrụ kọmishọna.
  • O nwetara ihe nrite 'omume pụrụiche' ndị otu NYSC n'afọ 2008, maka ọrụ gbasara ọrịa mmịnwụ nke bekee kpọrọ HIV ọ rụrụ na Sapele, Delta steeti.
  • O nwere ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ịkwalite ụmụaka nke ọ kpọrọ African Child Social Empowerment.

Ka BBC Igbo na Enemali kwuru n'ekwentị, o kwuru na ọ dị ya mkpa ịhụ na Anambara ga-adị ezigbo mma nke ga-eme ka e bido ịhụ ya dịka dike pụrụiche n'ihe gbasara nrụpụta ihe na azụmahịa.

N'okwu ọnụ ya ọ sị "tupu afọ anọ agafee, Anambara ga-abụ kakaraka n'ihe gbasara akụnaụba, nke ga-eme ka steeti ndị ọzọ nakwa ụfọdụ mba ndị ọzọ jere anyị".

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a