Akụkọ kachasi taa: Iwe ji onye nchịkọta Super Eagles
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Aka na-achi Enugu steeti, Ifeanyi Ugwuanyi akwadola ka a kwụọ ndị ọrụ ruru ọnụọgụgụ narị asaa na iri atọ na otu ụgwọ ọnwa.
Ebe foto si, Enugu Government/ Facebook
Ndị ọrụ a bụ ndị esi n'ụlọọrụ parastatal; ndị ọzọ na steeti ahụ webata dịka ndị ọrụ steeti ahụ.
Dino Melaye na ndị uweojii na-akwata ya
Ebe foto si, DIno Melaye/ Facebook
Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka e wepu kọmishọna ndị uweojii na Kogi steeti bụ Ali Janga.
Nke a bụ maka mmadụ isii ndị boro Dino Melaye ebubo gbanahụrị ndị uwe ojii.
Melaye enyekwala ndị uwe uweojii mkpụrụ ụbọchị abụọ ịchọta ha.
Na mba ofesi
Malala Yousafzai alaghachila obodo ya bụ Pakistan nke mbụ kemgbe ndị agha Taliban gbasịrị ya egbe.
Cheta na Yousafzai natara mgbo n'isi n'afọ 2012 maka na ọ na-ekwupụ okwu ka ụmụnwaanyị gụwa akwụkwọ.
N'egwuregwu
Obi adịghị onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr mma ebe Alex Iwobi nọ.
Ebe foto si, Getty Images
Naijiria, Argentina na Croatia ga-asọmpi
Nke a bụ maka mmeri Serbia meriri Naịjirịa na asọmpi enyi na enyi mba abụọ ahụ gbara.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
BBC Nkeji
Ihe nkiri
Ule ụlọ mkpọrọ
Kedu ndị kachasị esi ofe nke oma?
Ofe nsala bụ ofe na-amasị ndị Igbo nke ukwuu.
A na-eji ma azụ ndụ ma anụ ọkụkọ maọbụ anụ ewu esi ya.