Enwe achụpụla ndị mmadụ na Soluyi/Sosanya dị na Legọs

Enwe Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ na-ekwu na nsogbu enwe na-enye ha abụghị ọbere ihe, ma kpọkuo gọọmentị ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka

"Ị zụta ngwa nri dowe n'ụlọ gị, ị bata n'ụlọ otu ụbọchị ị hụ ka nri gị kwasara n'ala, ọ bụrụ na enwe akụwaala mpio gị, bata zuru nri gị." Ihe a bụ ihe ụfọdụ ndị na-ahụ na Legọs.

Otu onye bi na Sosanya, Gbagada dị na Legọs, bụ Gabriel Wopariwa, gwara BBC Pidgin na "enwe na-enye anyị oke nsogbu".

O kwuru sị "ọ bụrụ na ị debe nri gị n'ụlọ ma ị mechighị ọnụụzọ gị nkeọma, etu a ka enwe ga-esi bata richaa nri ị dowere."

Akụkọ ga-amasị gị:

Nkenke aha onyonyo Agbataobi Soluyi na Sosanya bụ ebe ka na-emepe emepe maka na ọ dịbu ka ime obodo mbụ

Wopariwa kwuru sị na ụfọdụ n'ime ha agabuola mkpesa na gọọmentị ime obodo Kosofe, mana onweghị ihe ha gatara.

Ndị agbataobi ahụ na-arịọ ndị gọọmentị ka ha gbalịa chụpụ enwe ndị a maka na ha na-awakpozi ndị mmadụ ugbua.

Ha kwuru na otu enwe busoro otu nwoke agha mere ka ebuga nwoke ahụ ụlọọgwụ, n'ihi na nwoke ahụ chụrụ ya ọsọ ka ọ chọrọ izuru akịbekee ya.

Nkenke aha onyonyo Ndị bi n'agbataobi Soluyi kwuru na ha na-ahụbu enwe ndị a ka ha nọ n'osisi n'ime ọhịa mgbe ebe ahụ ka bụ ime obodo, mana ugbua enwe ndị a na-enyezi ha nsogbu

Ichie Akin Adedoyin kwuru na o biela na Soluyi kamgbe afọ 1985.

O kwuru na oge ebe ahụ bụ ime obodo enwe ndị a bi n'ime ọhịa, na ha-anaghị enweta mkpesa ọbụla, mana ugbua obodo ahụ bidoro imepe, ha enwetela mkpesa karịrị akarị.

Ha kwukwara na o nwere otu nwoke bi ebe ahụ enwe ndị a na-agbakọ n'ụlọ ya, mere ha ji na-enyo ma ọ na-azụ ha azụ.

Nkenke aha onyonyo Ka agbataobi ahụ na-emepe, enwe ndị a enweghị ebe ha ga-anọzị maka na asụchaala ọhịa dị n'ogige ahụ ma mechie ọwara oke osimiri dị ebe ahụ

Onye ọzọ bi n'agbataobi ahụ bụ Joshua Okeke, kwuru na ọ na-eche na enwe ndị ahụ nwere ike ịbụ mmadụ maka etu ha si ahazi onwe ha.

O kwuru sị na itinyegodiri ha nsị na nri debe, ha agaghị eri ya.

O kwuru sị na enwe ndị ahụ anaghị achọ ụmụaka okwu, na ha na-egwusa ha egwuregwu, mana ha na-aba ndị okenye ọgụ.

Ndị agbataobi Sosanya kwuru na enwe ndị a na-apụta site n'elekere isii ruo asatọ nke ụtụtụ, ma pụtakwa n'elekere ise nke mgbede oge ha na-ebido ịchọ nri.

Ụjọ na-atụ ha ka enwe ndị a ebunyela ha ọrịa.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a