Ndị Enugwu e nwetala ọkaikpe ọhụrụ

Nnenna Alukwu
Nkenke aha onyonyo Nnenna Alukwu so na ọkaikpe ọhụrụ Gọvanọ Ugwuanyi họputara taa

Gọvanọ Enugwu steeti eduola ụmụnwaanyị ato n'iyi ọrụ dịka ndị ọkaikpe.

Ụmụnwaanyị atọ bụ ndị gnọvanọ na-achi Enugwu steeti duru n'iyi ọrụ tata dika ndị ọkaikpe.

Nkenke aha onyonyo Linda Okaibe so n'ọkaikpe ọhụrụ Gọvanọ Ugwuanyi họpụtara taa

Ndị ọkaikpe ọhụrụ ahụ bụ Linda Okaibe, Vera Ajogwu na Nnenna Alukwu.

Oge ọ na-edu ha na ya bụ iyi ọrụ tata, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi gwara ha ka ha were amamihe ọtụtụ afọ ha niile wee hụ na usoro ikpe na-aga ọsọ ọsọ n'Enugwu steeti.

Nkenke aha onyonyo Vera ajogwu so n'ọkaikpe ọhụrụ Gọvanọ Ugwuanyi họpụtara taa

Govano Ugwuanyi kwuru na n'ime mmadu asatọ e wegara aha ha na nke ndị otu 'Nigerian Judicial Council NJC', nani mmadụ atọ a bu ndi gafere na nyocha ndi otu ahụ mere.

Okaikpe Nnenna Alukwu, Vera Ajogwu nakwa Linda Okaibe ṅụrụ iyi ma kwekwaa nkwa na ha ga-arụ ọrụ ha nke ọma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: