Ntuliaka 2019: Atiku Abubakar chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala

Atiku Abubakar Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Atiku so na ndị gwuzobere APC

Onye bụbụ osote onyeisiala Naijirịa bu Atiku Abubakar ekwupụtala na ya ga-eso zọọ ọchịchị ka onyeisiala n'afọ 2019.

Atiku bụrụ osote Olusegun Obasanjo mgbe o rịrị oche ọchịchị site 1999 ruo 2007 kwuru nke a na Portharcout ụnyaahụ dịka ọ kwuru na ya ga-azọ ọchịchị ahụ n'okpuru pati PDP.

Atiku na ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na PDP gara Rivers Steeti ka ha na ndị isi PDP na steeti ahụ nwe mkpakọrịta.

Ọtụghị ndị mmadụ n'anya na Atịkụ kwụpụtara ebụmobi ya banyere ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 maka na a na-anụbụ kepukepu ya kemgbe ọ hapụrụ APC laghachi PDP n'afọ 2017.

Atiku n'onwe ya kwuru na ya na-enwepụta onwe ya ka onye ga-etinye Naịjirịa n'ụzọ ọhụrụ site n'ihe o kwuru bụ "ọdịda nnụkwụ APC".

Atiku kwuru na kemgbe 2015, gọọmentị APC mebiri akwụkwọ ahụike na ọrụ ndozi obodo site na-anaghị etinye ego na ha etu okwesiri.

"Kemgbe 2015, onwebeghi ụzọ ruru kilometre 100 gọọmenti APC rụrụ ebe ọbụla n'ala anyi," Atiku sịrị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onwerike ọbụrụ Buhari na ga-anọ n'isi ndị ndọrọndọro ọchichị nke 2019

Ọ tụkwala aka na ya na-eche na APC ayasala udo na ịdịnaotu nke ndị Naịjirịa nwere.

"Ahụbeghị m ka ndị Naịjirịa si otua kewa n'atụmatụ okwukwe, asụsụ nakwa ebe e si. Nkewa a sitere n'aka APC na etu ha si chịbie," Atiku kwuru.

Ndị APC asabeghị ya okwu a mgbe BBC Igbo dechara akụko a.

Okwu Rochas banyere ọchịchị Buhari

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRochas ekwenyeghị na Buhari na-emegbu ndị Igbo

Mana, Atiku bụ onye mbụ pụtara kwuo na ya ga-azọ ọchịchị ka onyeisiala na atụmatụ pati abụọ aha ha na-ada ụda na Naịjirịa bụ PDP na APC.

Agbanyeghị na ndị mmadụ na-ele anya na Muhammadu Buhari ga-apụta zọ ọchịchị iji mara ma a ga-enye ya agba nke abụọ, okwubeghị ma ọ ga-etinye ụkwụ na ya bụ ntụliaka 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: