PIBG: Mmanụ ụgbọala nwere ike ịda ọnụ

Ọdọ mmanụ ụgbọala Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụkọ mmanụ ụgbọala bụ nsogbu ekweghị ala ala na Naịjiria

Ọ bụrụ na onyeisiala Muhammadu Buhari kwado, iwu ọhụrụ ụlọomeiwu Naijiria tinyere aka maka ihazigharị mmepụta na ire mmanụ n'ala anyị ga-eme ka ọnụ mmanụ ụgbọala gbalite.

N' ụbọchị Wenezde, abali 28 nke ọnwa maachị, ụlọomeiwu nke etiti tinyere aka n'akwụkwọ iwu ịhazigharị mmepụta na ire mmanụ na Naijiria nke a kpọrọ Petroleum Industry Governance Bill (PIGB), na bekee nke kwadoro ka a na-akwụ ụtụ pasenti ise na mmanụ ụgbọala.

A ga-etinye ụtụ pasenti ise a, a ga na-akwu na mmanụ ụgbọala na akpaego ngalaba nke e mebere maka iji kwụghachi ndị oremmanụ ọghọm ọbụla ha nwetara site na ire mmanụ otu ọnụ dịka gọọmenti siri hibe nke a kpọrọ Petroleum Equalisation Fund (PEF).

PIGB bụ iwu mapụtara otu aga-esi na achi ma na-ahazi mmanụ ala na Naijiria.

Iwu ahụ kwukwara ka e kerie ngalaba na-ahụ maka ire mmanụ n'ala Naijiria nke a kpọrọ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC), na bekee ma wepụta nglaba ọhụrụ a kpọrọ ,'Nigerian Petroleum Regulatory Commission."

Iwu a nke e bidoro okwu ime ya n' afọ 2000 oge ọchịchị Olusegun Obasanjo butere ọtụtụ esemokwu n'etiti ndị omebeiwu nke mere o jiri nọọ odu ma nwekwa mmegharị dị icheiche.

Akụkọ ga-amasị gị: