Akụkọ kachasi taa: RMAFC ekwuola ka ndị sineti akọwa ego ha

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Obe

Ebe foto si, Getty Images

Taa bụ gud Fraidee ụbọchị a na-echeta ogbugbu Kraistị maka ndị ụka Kraistị.

Mmemme Ista asarala ọkụ n'ebe dị icheiche na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjira ebe ụka dị icheiche na-eme mmemme ahụ n'ụdị nke ha.

Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọkuola ndị ụka Kraistị niile ka ha kwụsị okwu akpọmasị, mpụ na ajọ ihe ndị ọzọ niile.

N'ozi Buhari zigara ndị ụka Christ ụnyaahụ dịka a na-akwado mmemme Ista, o kwuru ka ha ṅomie Kraistị n'agwa ya niile dịka ndị na-eso ya.

RMAFC ekwuola na ndị sineti ga-akọwa ebe ego ha si.

Ebe foto si, Nigerian Senate/ Facebook

Otu na-ahụ maka ikesa ego na Naịjiria a na-akpọ Revenue Mobilisation Allocation and Fiscal Commission, RMAFC, n'aha ịchafụ ekwuola na ha amaghị ka ego ndị sinetọ na-eri si ruo nde naịra iri na atọ na ụma.

Ha kwuru na ego ndị sineto kwesiri iri kwa ọnwa bụ naanị otu nde.

N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa agụpụtụla ndị referii mmadụ isii ga-arụ ọrụ n'asọmpi iko mbaụwa.

Ndị referii a, ga-enwe referii mmadụ iri si mpaghara Afrịka ga-abụ osote ha mana onweghị onye Naịjiria banyere ya.

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Ị bụụla onye isi nkwọcha n'oge erughi eru, lee ihe nwere ike ịkpata ya.

Aha onyonyo,

Ị bụrụla onyeisi nkwọcha?

Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma taa