Ntuliaka 2019: Ndị isi nchekwa Naịjirịa nwere nchegbu

Ndị isi nchekwa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ nchekwa gunyere ndị agha ala, agha elu, agha mmiri, DSS, NIA na ndị uweojii

Ọ bụrụ na ndị ọrụ nchekwa na-enwe nchegbu gbasara nchekwa na ntuliaka afọ na-abịa, kedụ ihe ụmụ Naịjirịa ga-emezi?

Nke a bụ ihe si n'akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba SHehu dere gbasara mkparịaụka ndị isi ọrụ nchekwa na ndị ntaakụkọ nwere n'Abuja.

N'akwụkwọ ahụ, Shehu dere; "Ndị isi ọrụ nchekwa gosipụtara nchegbu ọkachasị maka mkpamkpa ndị ọjọọ na-akpa iji kwatuo usoro a ga-eji mee ntuliaka nke afọ 2019.

O kwuru ka "ndị ntaakụkọ tinye uchu n'ọrụ ha ghara ikwe ka ndị dị etua duhie ha."

Akwụkwọ ahụ kwuru na ndị ọrụ nchekwa ahụ na-ekwu na nchekwa obodo Naịjirịọ́ dị mma karịa etu e si egosipụta ya n'igwe mgbasaozi ndị ntaakụkọ dị icheiche na Naịjirịa.

Ha gwara ndị ntaakụkọ ka ha rue ọrụ ha nkeọma ma kwado ndị ọụ nchekwa n'ọrụ ya ịhụ na Naịjirịa nwere nchekwa tọrọ atọ.

Gbasara ntuliaka 2019, ha dọrọ ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya maka ụfọdụ otu ọrụ ha bụ ịkwasa ọrụ niile ndị na-achikọba ntuliaka bụ INEC na-arụ.

Ndị isi ọrụ nchekwa ahụ gwara ndị ntaakụkọ ka nchekwa na idinaotu Naịjiria buru ụzọ n'ọrụ ha niile.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: