Njem Buharị: ọ bịara ịnata nkwado Tinubu maka 2019?

Buhari, Tinubu na nwunye ya Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Buhari mere Tinubu onye isi otu na-ekere ndị otu APC na-ese okwu udo

Ọtụtụ ndị njem gụnyere ndị njem ụgbọelu, ji ụkwụ gaa ogologo ụzọ n'ụbọchị Tọọsde, Maachị 29, na Legọs dịka e mechiri okporoụzọ na-aga ọdọụgbọelu na ụfọdụ okporoụzọ maka na onyeisiala Muhammadu Buhari gara njem nleta abalị abụọ na steeti ahụ.

Buhari gara mepee nnukwu ọdọụgbọala n'isi obodo Legọs bụ Ikeja, ma mecha gaa ọgbakọ mkparitaụka e hiwere iji mee ncheta ụbọchị ọmụmụ onyendu otu APC bụ Bola Ahmed Tinubu, onye gbara afọ iri isii na isii (66).

Mana dịka ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru, njem ahụ abụghị ihe a kpọrọ ya ka ọ bụ, kama na ọ bụ ịwụ ala mmiri maka ntuliaka 2019.

N'ụbọchị Wenesde, gọọmentị Legọs steeti mara ọkwa mmechi ọrụ nakwa okporoụzọ ụfọdụ maka abalị abụọ; ụbọchị Tọọsde na Fraide, Buhari ga-eme njem ahụ.

Nke metụtara ebe ọ dị ukwuu, mkpagharị ndị mmadụ, azụmahịa na iji ego chụọ ego na steeti nke na ọtụtụ ndị mmadụ kwusịrị ọrụ, ahịa, ebe ọtụtụ, nke mere ka nde kwuru nde ego gbanahụrụ steeti ahụ n'ihi njem onyeisiala.

Akụkọ ga-amasị gị

Nke a kpasuru ọtụtụ mmadụ iwe nke mere na ha tụrụ arịrị n'igwe okwu Twitter:

Nke a bụ mbụ Muhammadu Buhari na-abia Legos bụ ebe a maara dịka isi obodo akụnaụba Naijiria kemgbe o jiri banye n'ọkwa ọchịchị afọ atọ gara aga.

Dika Sam Olisa, onye ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Afrika si kwuo, Buhari bịara Legos maka inweta nkwado Tinubu maka 2019.

"Anyị kwesiri ịmata etu Asiwaju Tinubu si dị mkpa na mmeri Buhari nwere na ntuliaka emeburu na mbụ. Kemgbe o jiri banye ọkwa ọchịchị, Buharị abịabeghị Legọs. Ihe o jiri bịa bụ maka ịnweta nkwado Tinubu na ntulika na-abia na 2019."

Cheta na nsonso a, Buhari mere Ahmed Tinubu onyeisi kọmịti ga-ekpezi esemokwu dị n'etiti ndị otu pati ha bụ APC.

Ọ gara n'ihu kwado ka ewepụ onyeisioche party ha bụ Oyegun, onye nke Tinubu akwadoghị ọchịchị ya n'otu ha.

Nke mere ọtụtụ ndị na-ele ka o sị eme ji ekwu na ọ bụ maka 2019 n'ihi na kemgbe Buhari jiri banye n'ọchịchị, ọ gbakọtara onyendu pati ya bụ APC bụ Ahmed Tinubu onye bụ isi ejiri kwaba okpu n'inyeaka ka onwee mmeri na ntuliaka nke 2015.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Asiwaju bụ onye Aisha Buhari, nwunye onyeisiala, bu n'obi mgbe ọ gwara BBC na mkparịtaụka o nwere n'afọ gara aga na di ya gbakọtara ndị nyerela ya aka na ntuliaka azụ, ma makụọ ndị ya amaghị n'ọchịchị ya.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a