Akụkọ kachasi taa: Ndị uweojii jidere onye bepụrụ mmadụ isi

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nimbo bụ obodo ahụ ndị na-chị ehị kparamkpamkpa na Enugu Steeti

Aka akparala nwaamadị gburu ma bere isi otu nwaanyị aha ya bụ Susan Enejere n'Ugbene Ajime dị n'okpuruọchịchị Ụzọụwanị n'Enugwu Steeti.

Ndị ọrụ a bụ ndị esi n'ụlọọrụ parastatal; ndị ọzọ na steeti ahụ webata dịka ndị ọrụ steeti ahụ.

Ọgbakọ ọhaneze ndị Igbo, Afenifere, PANDEF nakwa Middle Belt Forum zụkọrọ na Yenegoa.

Ndị otu a amụtala nwa ọzọ aha ya bụ Mass Alliance for Inclusive Nigeria, MAIN Front n'aha ịchafụ.

Nwa ọhụrụ a bụ nke ga-enyere ndị kwerenu aka ịchụpado ihe gbasara ihazigharị ọchịchị obodo bekee kpọrọ restructuring.

Nnia Nwodo bụ onyeisi ndị Ohaneze kwuru nke a na mkparịta ụka ya na BBC taa.

Na mba ofesi

Ụnụ ahụla na ihenwa asị ya gwọọ ọrịa bịazịrị ogbugbu?

Ọ bụ gịnị na-afịọ?

Waya otu nwaanyị Australia bụ Linda Schulz tinyere n'ime ahụ ya iji kwalite afọ na akpamamịrị nwaanyị mụrụ nwaọhụrụ bidoro i yikasị ya ahụ.

Linda na ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ ihe a metụtara rịọrọ ndị omeiwu obodo ha ka ha mechie ya bụ usoro ịgwọ ọrịa. Ọ ma akwa asa ahụ mara onwe ya.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo FIFI nwe ịkpokọba egwuregwu bọlụ n'ụwa niile

N'egwuruegwu FIFA ekwetela na ha ga-elebeanya n'okwu akpọmasị nke ndị France boro ndị Russia mgbe ha sọrọ mpi enyi na enyi ụbọchị Tuzde gara aga.

Ndị osee foto Reuters na AFP gbara akaebe na ha nụrụ ka ndị Russia kpọrọ ndị isi ojii ndị France adaka.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionFrank Edwards: Ọ bụghị egwu ka m kwadoburu ịgụ

Ọbịbịa onyeisiala

Muhammadu Buhari bịara Legọs taa.

Ndị mmadụ kwuru ihe ha nwere ike ịjụ ya ma ha hụ ya n'ụzọ.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a