Akụkọ kachasi taa: Okorocha na Arch. katọlik Owerri

Gọvanọ Okorocha a maala Katọlik bishọp nke Owerri Diocese, bụ Anthony Obinna aka mgba.

Okorocha gwara Arch Bishop sị, ihe ọsọkwara ya mee na o nweghị ike ịtụkwasa onye patị APGA n'isi ndị Imo ka ọ chịa ha.

Okorocha sịrị na Arch Bishọp siri onwe ị maja ya na ozi Easter ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Okorocha na Arch. Bishọp Katọlik na-enwe ngbọtaghie

Aka enwe n'ofe ndọrọndọrọ ọchịchị 2019

Image copyright Garba Shehu/Facebook
Nkenke aha onyonyo Garba Shehu ojeozi onyeisiala na mgbasa ozi

Adọla ndị ntaakụkọ aka na ntị ka ha kpachara anya maka ndị otu ọjọọ na-achọ ịkponye aja na garrị ntụliaka ọchịchị nke 2019.

Garba Shehu bụ ojeozi mgbasa ozị onyeisiala gwara ndị isi ọrụ ntaakụkọ nke a ụnyaahụ mgbe ọ sị na enyopula aka enwe n'ofe ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.

Russia achụọla ndị nọchiteanya US iri isii na mbọrọ ọbọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkọrọtọ mba US na Russia

Mba Russia ekwuola na memmegwara anaghị ese okwu.

Russia asịla mmadụ iri isii ndị nnọchiteanya mba US ha kwara ngwongwo ha laa iji bọrọ ọbọ ihe US mere ha.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Man U na Liverpool

A họpụtala Liverpool na Manchester United na otu egwu bọlụ ga-esọ kwakọrịta mpị na egwuruegwu iko International Championship.

Real Madrid, AC Milan na Juventus ga-eso sọọ ya bụ mpi nke a na-atụ anya a ga-agba na Michigan US n'ọnwa July.

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa

Ụzọ atọ nwaanyị sị kwesi idozi onwe ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤzọ atọ nwaanyị kwesiri idozi ahụ ya

Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma taa