'Afrịka ga-akọ akụkọ ndị Afrịka' - Mo Abudu

Mark Young (osoteonyesi nke ukwu ụlọọrụ Sony UK, Iberia na Africa), Mo Abudu (onyeisi, EbonyLife TV na Films) na Kunle Falodun, (osoteonyesi, Distribution Africa) Image copyright EbonyLife/Sony
Nkenke aha onyonyo Mark Young (Sony TV), Mo Abudu (Ebony Life TV) na Kunle Falodun

Ihe ọhụrụ na-abịa n'ụlọọrụ ihe nkiri nke EbonyLife TV.

Akụkọ sị ụlọọrụ a kwuru na Ebony Life na Sony TV, bụ ụlọọorụ ihe nkiri nke ala bekee, ebinyeela aka n'akwụkwọ maka imekọ ihe n'ime ọrụ ihe nkiri.

N'ime akwụkwọ ozi Ebony Life zipuru ndị ntaakụkọ, ha kwuru na nke a bụ nke mbụ ụlọọrụ ihe nkiri nke ala Naijirịa na Sony ga-ebinye aka na akwụkwọ imekọ ihe.

Ihe a pụtara na Ebony na Sony ga-ebido ihe nkiri dị icheiche. Ha kwuru na ugbua a mụpụtala ihe onyonyo atọ nke ọhụrụ. Otu n'ime ihe nkiri a nke akpọrọ 'Dahomey Warriors' na bekee.

Onyeisi Ebony Life bụ Mo Abodo kwuru n'ime akwụkwọ ozi a na kemgbe amụpụtara ụlọọrụ Ebony Life n'afọ 2013, ihe kachasị dị ya mpka bụ ị gbanwee etu ala ndị ọzọ sịrị hụ mba Afrịka.

Image copyright Ebony Life
Nkenke aha onyonyo 'Fifty' so na ihe nkiri ọhụrụ Ebony Life TV mụpụtara

O kwuru, "Ihe m chọrọ bụ ka anyị bụ ndị ụmụafọ Afrịka bụrụ ndị ga-akọ akụkọ anyị ka anyị sịrị chọ."

Akụkọ ga-amasị gị

Mo kwuru na obi na-atọ ya ụtọ, na akụkọ di icheiche sị mba Afrịka ga-erute mba ụwa niile maka mbinye aka a mere.

Uru o nyere Nollywood

Nollywood bụ otu na-eme ihe nkiri gbasara Naịjirịa na Afrịka nke amaama na mba ụwa.

Ụlọọrụ dịka Ebony Life TV enyeela otu a n'ịkwado nke ọma, makana ọtụtụ ihe nkiri amụpụtara mere ka ụwa mara maka Nollywood nke oma, dịka ihe nkiri 'Wedding Party', 'Fifty na Royal Hybiscus Hotel'.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nollywood na-eso Bollywood nke ala Idia na Hollywood nke ala Amerika n'ọrụ ihe nkiri

Wedding party na Royal Hybiscus Hotel pụtara na mmemme gbasara ihe nkiri ha na-eme na Toronto n'obodo Canada.

Na afọ 2014, gọọmentị Naịjirịa kwuru na Nollywood bụ otu ruru ijeri dọla atọ.

Ọrụ ka dị

Ndị ohi akpọrọ pirates na bekee ka na-emebi ọrụ ndị ihe nkiri na Nollywood. Otu akpọrọ National Bureau of Statistics deree na sọọsọ otu percent n'ime ijere dọlas atọ na ba aka ndị nwere ihe nkiri a.