Mmemme Good Friday: Ndi uka ji ejije na egosiputa ọnwụ Jeso

Ndị ihe nkiri Good Friday
Nkenke aha onyonyo Ndị ụka Kristi na-echeta ụbọchị akpọgburu Jeso taa

N'ọtụtụ ụlọuka ha guzobere ihe ejije iji gosiputa ahụhụ Jeso tara tupu akpọgbue ya n'elu obe.

Na Blessed Sacrament Parish dị na independence layout Enugu, ndị mmadụ zụkọtara n'igwe kpagharia were ejije ha mụrụ wee gosi ka ndị Jew na Pilate sịrị kpogbue Jeso n'obe.

Akụkọ ga-amasị gị

Onye na-achịkọba ya bụ ngagharị nke obe ịkpeazụ tupu Easter na parish ahụ bụ Rev. Fr, Ogbozo gwara ndị otu Kristi ka ha nọrọ na nche oge niile ma hụ onwe ha n'anya dịka Jeso sịrị hụ ndị tụkwasara ya obi anya.

Nkenke aha onyonyo Ndị uka Kristi n'ụbọchị Good Friday

Ka emechara ngagharị nke obe ahụ, eme kwara mmemme isusu obe ọnụ nke na-egosiputa ọgbụgbandụ Jeso na ndị kwere na ya.

Gud Fraịde bu nnukwu emume na-eweta Lent n'isi njedebe tupu Jeso ekulie n'ọnwụ n'ụbọchị Easter dika ka ndị otu Kristi sị kwenye. .