Mmerụaka: PDP na APC na-akwata

Uche Secondus Image copyright PDP Official Facebook page
Nkenke aha onyonyo Uche Secondus bụ onyeisioche ndị PDP kemgbe ọnwa Disemba 2017

Otu PDP ekwuola n'aha Gọọmenti etiti nke APC nọ n'isi ya wepụtala dịka ndị ha na-ebo ebubo na ha zuru ego Naijiria n'oge ọchịchị PDP bụ awọ ikpọ awọ ibe ya wọkọm, n'ihi na e nwere ọtụ ndị nọ n'ọchịchị APC eborola ebubọ mmerụaka aka.

N'ụbọchị Fraidee, Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ, Lai Mohammed, wepụtara aha ndị gọọmenti etiti na-ebo ebubo na ha zụrụ ego ala Naijiria n'oge ọchịchị PDP.

Aha ndị ọ gụnyere bụ onyeisioche otu PDP bụ, Prince Uche Secondus(N200m); onye nwe ụlọọrụ Daar Communications bụ Raymond Dokpesi(N2.1 billion), na onye bụ odeeakwụkwọ mgbasaozi PDP bụ Olisa Metuh(N1.4bn), onye bụbu onye enyemaka ukwu Goodluck Jonathan, bụ Dudafa Waripamo-Owei(N830 million).

Mana ọsịsa ha, otu PDP site n'ọnụ odeeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ, Kola Ologbondiyan, sị na otu APC ịtụ ndị otu ha aka na ha buru ego bụ awọ ikpọ awọ ibe ya wọkọm.'

N'akwụkwọ ozi ha, otu PDP gụpụtara ndị nọ n'ọchịchị Muhammadu Buhari eborola ebubo mmerụaka ndị PDP kwuru na ha kpobara ebubo ahụ ọhịa.

"Nke a bụ gọọmenti akọwanwughị maka $26 billion (N9 trillion) ezuru na ọrụ ngo NNPC, mmanụ agbịdị dara N1.1 trillion nke e jiri tọọ mkpa APC, N18 billion ego ehiwere maka ndị nọ ebe ndị ọ gbara ọsọ ndụ a na-akpọ IDP nke ha boro ebubo na ndị APC, gụnyere odeeakwụkwọ gọọmenti etiti,Babachir Lawal, zuru.

Nkenke aha onyonyo Lai Mohammed kwuru na e wepụta aha ndị ahụ bụ iji zaa oku ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ ka agba aha ha n'anwụ

PDP sị: "Ijeri naira iri, ego ehiwere maka ahụike nke a kpọrọ NHIS n'afa ịchafụ nke aka na-arụ ụfọdụ ndị otu imeezi Buhari ndị a na-akpọ 'cabal' na bekee, nakwa, 'Mainagate', ebe gọọmenti APC kpọchịgha ma nyeghachi n'ọrụ onye ahụ onye a tụrụ aka na o mere mpụ a rụrụ ijeri kwuru ijeri."

PDP mara Lai Mohammed aka ya kpọpụta aha ndị pati ha ndị amarala ikpe maka ibu ego.

"Aha nke a gọọmentị etiti wepụtara dịka ndị buru ego bụ imechu aha erijughị afọ n'ihi na onweghị ndị a mara ikpe n'ụlọikpe maọbụ otu nyocha n'ala Naijiria."

PDP gara n'ihu kwuo n'aha ahụ edepụtara bụ gọọmenti etiti iga n'ihu na ị ma ndị otu ha ikpe n'ime akwụkwọ ntaakụkọ, ma mara ha aka iwepụta aha ndị otu ha amaraikpe n'ụlọikpe.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a