Sierra Leone na-emezu ntulịaka taa

Ọdụ akwukwọ akụkọ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mmetọpụ ntuliaka a gburu oge n'ihi ebubo wuruwuru eboro na nke mbu e mere.

Onye ndu ndị ijiburu egbe nara ọchịchị mba ahụ bụ Julius Maada Bio na onye onyeisiala mba ahụ choro ka ọnọchie ya bụ Samura Kamara na-azọ ọkwa onyeisiala.

Mmetọpụ ntuliaka a gburu oge n'ihi ebubo wuruwuru eboro na nke mbu e mere.

Maada Bio bụ onye kachasị nweta votu n'agba nke mbụ ha mere nwetara pasenti 43.3%.

Mana n' ala Sierra Leone, a na-ahọpụta onyeisiala site n'onye nwetakacharị votu doro anya.

Ọ bụrụ na onweghị onye nwetara pasent 55, e mee agba nke abụọ.

Onyeisiala ha bụ Ernest Bai Koroma ga-arịtu n'ọchịchị dịka ọ chịchara

Ọ họrọ Kamara bụ onye bụ ọkamuta n'ihe gbasara akụnaụba ka ọ zọ n'aha pati ha bụ All People's Congress (APC).

Koromo meribụrụ Maada Bio, bụ onye na-edu ndị otu anya ha dị n' ọchịchị ma ha anọghị n'ọchịchị bụ Sierra Leone People's Party (SLPP), oge e mere ntuliaka ikpeazụ na mba ahụ.

Maada Bio chịburu mba Sierra Leone nwa obere oge, mgbe ya na ndị agha otu ya weghara ọchịchị n'ike n'afọ 1992.

Ka afọ anọ gachara, o weghara ọchịchị ọzọ n'ike ma chịa Sierra Leone bido n'ọnwa Janụwarị rue Maachị afọ 1996.

Akụkọ ga-amasị gị: