Anyị ga-anakọsị mmadụ egbe niile - Komịshịọna uweojii

Danmallam Mohammed
Nkenke aha onyonyo Kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed ekwuola na ndị uweojii na-ebuso ndị na-enupu isi n'iwu ọgwụ na steeti ahụ

Iji rube isi na iwu inspector General nke ndị uwe ojii na Naijiria bụ Ibrahim Idris nyere, ndị uweojii n'Enugwu steeti ekpokotala egbe dị 148.

Onye kọmịshịọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Danmallam Mohammed gosiri ndị ntaakụkọ egbe nile ndị ahụ, nke okwuru na ha napụtara ndị mmadụ iji wee Chekwa ndụ na akụ na ụba.

Egbe na ngwa ọgụ ndị ahụ gunyere; Ak 47 10, Egbe pump action 13, obere egbe nwere otu barrel 33, obere egbe nwere ọnụ abụọ 36, Egbe obere nwere ọnụ asatọ, revolver atọ, obere egbe Barrera 11, ogologo egbe otu barrel 18, ngwo ngwo egbe ndị ọzọ, nakwa mgbọ egbe mejuputara ọnụ ọgụgụ.

Nkenke aha onyonyo Ụkọ ọrụ na-ebute nnupu isi n'iwu

Kọmishịọna Danmallam kwuru na ihea bụ mmeri ha nwetara na-agba nke mbụ ha jiri bido ya bụ ịnapụ ndị mmadụ egbe dịka onye isi ha kpata kpata siri nye ha iwu.

Otoro ọrụ gbanụ gbanụ nke ACP Frank Idu nọ n'isi ya ma gwa ha ka ha were ngwa ngwa nakọtasịa egbe nine ndị mmadụ ji.

Ọ gwakwara ndị mmadụ ka ha jiri aka ha were egbe ha nwere n'ulo ha nyefee ndị uweojii ghara iche ka ewere aka ike bịa nara ha ya.

Ya bụ ọrụ gbanụ a ka ndị uwe ojii n'Enugwu kwuru na ọga adị ire ruo mgbe ha nakọsịtachara ndị mmadu nkịtị egbe ha ji.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a