Ndị ụka Kraịst na-eme emume Ista

Ụkọchukwu nke ukwu bụ Callistus Onaga
Nkenke aha onyonyo Ụkọchukwu nke ukwu bụ Callistus Onaga

Ndị otu kraịst n'ụwa niile na- eri oriri Ista iji wee nwee aṅurị na Jeso ebiligo n'ọnwụ.

Ọtụtụ ụlọụka dị icheiche jị ụka pụrụ iche na-emerube ya bụ Ista.

Na Holy Ghost Cathedral Church dị n'Enugwu ka onye isi nchụaja n'Enugwu Katọlik Diocese bụ Bishop Callistus Onaga, kpọrọ oku ka ndị otu kraịst nwee olileanya na otee aka ọ dị njọ, emesia ọ ga-adị mma.

Onaga kwuru na ndụ Jeso biri n'ụwa na-egosi anyị na ị nwe okwukwe, ndidi, nakwa olileanya n'ebe chukwu nọ, dị ezigbo mkpa.

O kwuru na Jeso tara ahụhụ, nwuọ ọnwụ n'elu obe ma merie ọnwụ tata wee kuziere anyị na onye kwudosiri ike ga-enwe mmeri.

Na ya bụ ofufe nru ka bishop Onaga nọrọ gọzie ndị na-anata oriri izizi ebe ndị ụka jikwa imụnye kandle wee gosi na Jeso bụ ihe, emeriela ọchịchịrị site na mbilite n'ọnwụ ya.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara