Saụt Korịa zipụrụ ụgbọ agha mmiri na Ghana

Ụgbọ aghammiri ndị Saụt Koria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụgbọ aghammiri ndị Saụt Koria nọbụ na "Gulf" nke Guinea

Mba Saụt Koria ezigala ugbo mmiri agha na Ghana ka ndi omekome nọ na oshimiri tọọrọ ndị Koria atọ.

Ndị Koria a atọọrọ nọ n'ime ụgbo mmiri akpọrọ Marine 711 bu mmadụ 40 ọzọ bụ ndị Ghana mgbe ndị omekome a wakporo ha na ubọchị Mondee nke izuụka gara aga.

Ndi omekome a nwuchikọrọ ndị Koria wee jiri obele ụgbọ mmiri na-agba ezigbo ọsọ gbafuo.

Ka ihe a mechara, Marine 711, bụ ụgbọ ji akwụkwọ ikike ndị Ghana, were gawa ọdọụkpọmmiri na Ghana ebe ndị isi ojii o bu rituru, dịka ndi ntaakụkọ Yonhap nke Saụt Koria kwuru.

Ndịagha Saụt Koria na-akọwa na ọ bụ ndị Naijirịa kpara ya bụ ike.

Ụgbommiri nke Saụt Koria akpọrọ "Munmu the Great" nọ bụ ebe a na-akpọ "Gulf of Eden" na arụ ọru nchekwa tupu e ziga gawa ka ọ ga zọpụta ndị ahụ atọọrọ.

Mpaghara gọọmenti Kọria na ahụ maka ihe gbasara mba ofesi kwuru na ha na ndị Naịjirịa, Ghana, Togo na Bini nakwa Amerịka na Europe na gba mbọ ịhụ na ndị ahụ pụtara.

Ndị omekome kpara ike a ekwụbeghị ebumnobi ha, maobị egole ha ga eji tọghapu ndi ha ji.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara