Mmadụ 15 nwụrụ na Maiduguri - Ndịagha Naịjirịa

Ndị gbara ọsọ ndụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka gbara ọsọndụ maka nsogbu ndị Boko Haram

Ndịagha Naịjiria ekwuola na ihe ruru mmadụ 15 nwụrụ ebe mmadụ 83 merụrụ ahụ n'ọgụ dara n'etiti ha na ndị otu Boko Haram n'abali ụnyaahụ.

Onye na-ekwuchitere ndịagha Naịjiria bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ndịagha wakporo ọtụtụ ndị Boko Haram ebe ha na-achọ ụzọ ha si abata Maiduguri were ọnọdụ.

Nwachukwu gara n'ihu sị "Ndịagha anyị chọtara egbe abụọ na ngwa ọgụ ndị ọzọ n'aka ndị na-eyi ndụ egwu."

Ha gbagburu ndị Boko Haram ruru isii ma kwụsịkwa ndị asaa ọzọ na-akwadọ ị gba ogbunigwe ebe ahụ.

Nwachukwu kwuru na-ebe ndị otu ahụ hụrụ na ha agaghị enwe ohere me uche ha, ha malitere igbu ndị bi n'obodo Biile Shuwa na Alkarantị dị na mpaghara Maiduguri.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ

Cheta na akụkọ pụtara n'ụtutu na ụda egbe n'ogbunigwe si ihu agha dị nso na Maiduguri na-agba ndị mmadu ụra.

Ndị ma maka ihe na-eme n'ọrụ nchekwa na mpaghara Maiduguri sị na ọ bụ ndịagha Naịjiria na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram na-akwa mgbọ oge ahụ.

Cheta na kemgbe afọ itoolu, ndị Boko Haram na ndịagha Naijirịa na-akwata mgbọ na ugwu ọwụwa anyanwụ Naịjiria.

N'afọ gara aga, onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na ha emeriela Boko Haram, mana ihe na-eme egosighị na okwu ha bu eziokwu.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a