Ejidela mmadu anọ chọrọ ịma nwaanyị elu n'ike n'Enugwu

Ebe foto si, Ebere Amaraizu
Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu
Ndị Uwe Ojii n'Enugwu steeti kwuru na ha ejidela otu nwata nwoke chọrọ ka ọ maa nwaanyi elu n'ike n'abalị fotara Easter Sunday.
Ya bụ mkpamkpa ka nwata nwoke ahụ na ndị otu ya mere n'Okpara Square dị n'Enugwu.
Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru na ha jidere ya bụ nwata nwoke ebe ọ na achọ ịma nwanyị elụ n'ike ma jidekwa ndị otu ya atọ ọzọ ndị so ya kpaa ya bụ nkata ọjọọ.
Amarizu kwukwara na ndị a ndị uweojii kpara aka wakporo ya bụ mmemme iti egwu, na-achọ ịma ụmụnwanyị elu n'ike ma nakọrọ ọtụtụ mmadu akpa ha, ego nakwa ekwe nti.
O kwuru na nyocha na-aga n'ihu ugbua, na ngwa ngwa ndi uwe ojii mesịrị nke a, onye ọbụla so kpaa ya bụ nkata ọjọọ ga anụ ụda ya.