Ejidela mmadu anọ chọrọ ịma nwaanyị elu n'ike n'Enugwu

Onye na ekwuchitere ndị uweojii ọnụ ha n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu

Ebe foto si, Ebere Amaraizu

Nkọwa foto,

Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu

Ndị Uwe Ojii n'Enugwu steeti kwuru na ha ejidela otu nwata nwoke chọrọ ka ọ maa nwaanyi elu n'ike n'abalị fotara Easter Sunday.

Ya bụ mkpamkpa ka nwata nwoke ahụ na ndị otu ya mere n'Okpara Square dị n'Enugwu.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru na ha jidere ya bụ nwata nwoke ebe ọ na achọ ịma nwanyị elụ n'ike ma jidekwa ndị otu ya atọ ọzọ ndị so ya kpaa ya bụ nkata ọjọọ.

Amarizu kwukwara na ndị a ndị uweojii kpara aka wakporo ya bụ mmemme iti egwu, na-achọ ịma ụmụnwanyị elu n'ike ma nakọrọ ọtụtụ mmadu akpa ha, ego nakwa ekwe nti.

O kwuru na nyocha na-aga n'ihu ugbua, na ngwa ngwa ndi uwe ojii mesịrị nke a, onye ọbụla so kpaa ya bụ nkata ọjọọ ga anụ ụda ya.

Akụkọ ga-amasị gị