Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: A na-akwa mgbọ na Maiduguri

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

A na-akwa mgbọ na Maiduguri

Akụkọ si Maiduguri apụta n'ụtụtụ a na-akọwa n'ụda egbe na ogbunigwe na-agba ndị mmadụ ụra.

Ndị ma maka ihe na-eme na Maiduguri si na ọ bụ ndịagha Naịjiria na ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram na-akwa mgbọ.

E kwubeghị ma o nwere onye nwụrụ.

Okorocha emejọla Chukwu na ndị Imo steeti

Bishọp ụka ndị Anglikan nke Diocese Egbu bụ Rev Geoffrey Okoroafọr ekwuola na ọchịchị Gọvanọ Imo steeti bụRochas Okorocha bụ emejọla Chukwu na ndị Imo steeti

Ọkoroafor kwuru na ebe Okorocha jisike akwanye ọgọ ya n'ọkwa ọchịchị gosiri na o bughị oganiru ndị Imo steeti n'uche.

Na mba ofesi

Mgba dị n'etiti China na US jisike na-aga niru; China etinyeso la ego n'elu ụgwọ ụtụ mba Amerịka ga-akwụ ma ha na-ebubata ngwa ahịa n'ala China.

Ha ji ihe ruru pesentị iri abụọ n'isee were bunyie ụgwọ ụtụ ahụ ga emetụta ihe ndị dịka anụ ezị na mmanya nke ndị Amerịka na-arụpụta

N'egwuregwu

Ibrahimovich nke a na-akpọ 'Ọdụm' nyere gọọlụ ikpe azụ bunyiri otu ya na mmeri n'asọmpị ha na LA FC gbara ụnya ahụ.

Zlatan Ibrahimovich jiri ọkpụ goolu abụọ were bido ọrụ ya na otu egwuregwu bọọlụ akpọrọ LA Galaxy.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Kedụ ndị kwesịrị iyi isiagụ

Isiagụ ọ na-ekwesi ụmụnwaanyị ka ọ bụ nanị ụmụnwoke kwesiri ị na-eyi ya?