Akụkọ kachasi n'abalị a: Winnie Mandela anwụọla
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a
Ndị uweojii anwụchiela mmadụ maka mwakpo
Ebe foto si, Ebere Amaraizu
Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbara ama na-awakporo ụmụnwaayị n'Enugwu
Ndị uweojii n'Enugwu steeti kwuru na ha ejidela mmadụ anọ chọrọ ịma nwaanyi elu n'ike n'abalị fotara Easter sụnday.
Ya bụ mkpamkpa ka nwata nwoke ahụ na ndị otu ya mere n'Okpara Square dị n'Enugwu.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu kwuru na ha jidere otu nwata nwoke ebe ọ na achọ ịma nwaanyị elụ n'ike ma jidekwa ndị otu ya atọ ọzọ ndị so ya kpaa ya bụ nkata ọjọọ.
Ọgụ ndịagha Naịjirịa na Boko Haram
Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ
Ndịagha Naịjiria ekwuola na ihe ruru mmadụ 15 nwụrụ ebe mmadụ 83 merụrụ ahụ n'ọgụ dara n'etiti ha na ndị otu Boko Haram n'abali ụnyaahụ.
Onye na-ekwuchitere ndịagha Naịjiria bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ndịagha wakporo ọtụtụ ndị Boko Haram ebe ha na-achọ ụzọ ha si abata Maiduguri were ọnọdụ.
Ha gbagburu ndị Boko Haram ruru isii ma kwụsịkwa ndị asaa ọzọ na-akwadọ ị gba ogbunigwe ebe ahụ.
Winnie Mandela anwụọla n'afọ 81
Ebe foto si, Getty Images
Winnie mụtara ụmụ abụọ oge ya na Nelson Mandela bụ di na nwunye
Winnie Madikizela Mandela wụbu nwunye Nelson Mandela tupu ọ rigoro n'oche ọchịchị mba Saụt Afrịka, anwụọla ka ọ dị afọ iri asatọ na otu.
Ọnụ na-ekwuchitere ezinaụlọ ya bụ Victor Dlamini kwuru na ọ nwụrụ ka ọ rịatechara ọrịa aka.
Dịka di ya bụ Nelson Mandela, Winnie mechara gaa ụlọmkpọrọ maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị..
N'akụkọ egwuregwu
Ebe foto si, Reuters
Alan Pardew abụrụla onye nchịkọta premier league nke iri ga-ahapụ ọkwa ya n'ime afọ 2017/2018
Ndị otu Westbromwich Albion achụpụla Alan Prdew n'oche nchịkọta ha.
Pardew chịkọtara West brom naanị ọnwa anọ tupu achụpụ ya taa.
Ọ nọchiri anya Tony Pulis n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba 2017, mana ugbua Darren Moore ga-anọchi anya ya.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa
Mkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo
Ị ma etu nwaanyị si Enugwu ji bụrụ 'mama Boko Haram'?
Mama Boko Haram kwuru otu nwaada si Enugwu steeti jiri bụrụ nne ndị Boko Haram.
O kwukwara na ụjọ anaghị atụ ya maka ndị Boko Haram ịmerụ ya ahụ.
Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: A na-akwa mgbọ na Maiduguri
Ndị na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram ebidola ị luso ndị agha Naịjiria ọgụ ọzọ na Maiduguri.