Ebe nwoke nọ gbuo nwanne ya maka ịdụ ụlọ na Sango Ota

Ụlọ obibi ezinaụlọ Okoro, nwoke nwanne ya gburu
Okwudili ji mma oge we beka sia nwanne ya nwoke a na-akpọ Azubike Okoro na nwunye ya bụ Jacinta ebe ha nọ na erị nrị.
BBC Igbo ghọtara na Okwudili mụrụ ọrụ n'aka Azubike ebe ọ na-azụ ahịa osikapa, agwa na ihe ndịọzọ ihe ruru afọ atọ na Azubike ekwesila idu ya n'odibo mana ọ dughị ya.
Otu onye agbatobi ha nọ mgbe ihe a mere a kpọrọ Esther gwara BBC Igbo na ọ bụ okwu ego na-ese n'etiti ụmụ nwanne ahụ.
Akwa mmiri dị n'azụ ụlọ ezinaụlọ Okoro ebe ejidere Okwudili
Ọ sị na ọ bụghị ụbọchị ahụ Okwudili gburu nwanne ya bụ mbụ ọ nara ya ego ọ na-atụ anya n'aka ya bụ Azubike.
Gee ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a:
Nwoke egbuola nwanne ya na nwunye nwanne ya maka ego
E jidere Okwudili ebe ọ na-achọ ị si mmiri dị n'azụ ụlọ obibi ha agba ọsọ maka mkpọtu nwanne ya mere tupu ọ nwụọ.
Ndị uiweoji nọ na-agba Sango Ota kwuru na eburu la Okwudili gaba isi ụlọọrụ ha dị na Abeokuta maka nyocha zuruoke.
Ha sị kwa na ha na-agba mbo ị chọta otu nwoke a kpọrọ Kenneth so Okwudili were gbuo Azubike na nwunye ya.