Ebe nwoke nọ gbuo nwanne ya maka ịdụ ụlọ na Sango Ota

Ụlọ obibi ezinaụlọ Okoro nwoke nwanne ya gburu
Nkọwa foto,

Ụlọ obibi ezinaụlọ Okoro, nwoke nwanne ya gburu

Okwudili ji mma oge we beka sia nwanne ya nwoke a na-akpọ Azubike Okoro na nwunye ya bụ Jacinta ebe ha nọ na erị nrị.

BBC Igbo ghọtara na Okwudili mụrụ ọrụ n'aka Azubike ebe ọ na-azụ ahịa osikapa, agwa na ihe ndịọzọ ihe ruru afọ atọ na Azubike ekwesila idu ya n'odibo mana ọ dughị ya.

Otu onye agbatobi ha nọ mgbe ihe a mere a kpọrọ Esther gwara BBC Igbo na ọ bụ okwu ego na-ese n'etiti ụmụ nwanne ahụ.

Nkọwa foto,

Akwa mmiri dị n'azụ ụlọ ezinaụlọ Okoro ebe ejidere Okwudili

Ọ sị na ọ bụghị ụbọchị ahụ Okwudili gburu nwanne ya bụ mbụ ọ nara ya ego ọ na-atụ anya n'aka ya bụ Azubike.

Gee ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a:

Aha onyonyo,

Nwoke egbuola nwanne ya na nwunye nwanne ya maka ego

E jidere Okwudili ebe ọ na-achọ ị si mmiri dị n'azụ ụlọ obibi ha agba ọsọ maka mkpọtu nwanne ya mere tupu ọ nwụọ.

Ndị uiweoji nọ na-agba Sango Ota kwuru na eburu la Okwudili gaba isi ụlọọrụ ha dị na Abeokuta maka nyocha zuruoke.

Ha sị kwa na ha na-agba mbo ị chọta otu nwoke a kpọrọ Kenneth so Okwudili were gbuo Azubike na nwunye ya.

Akụkọ ga-amasị gị