Akụkọ kachasi n'abalịa: Amatala onye wakporo ụlọọrụ YouTube
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa.
Gọvanọ Okezie Ikpeazu: 'Anyị na-agba mbọ ịlekọta ndị ihe mberede okporoụzọ a metụtara'
Ebe foto si, @okezieikpeazu
Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015
Mgbe BBC Igbo gbara onye Kọmishịọna mgbasa ozi nke Abia Steeti bụ John Okeiyi ajụjụ ọnụ n'ekwe ntị, o kwuru na nke a bụ eziokwu.
Okeiyi kwuru na ọ gaarala ezinaụlọ ndị ahụ mgbaru, kwuo na Gọvanọ Okezie Ikpeazu na-agba mbọ ịhụ na ndị merụrụ ahụ na-atara ọgwụgwọ tara ọchịchị.
Okeiyi gwara BBC Igbo na nwunye Gọvanọ nọ na oke iri uju, na ọ gaghị enye ohere ị zaa ajụjụ ọnụ mgbe ahụ.
Ndị uweojii Enugu Steeti ekwuola na onweghị ụmụnwaanyị awakporo n'Egugu
Ebe foto si, Ebere Amaraizu
Ndị mmadụ na Twitter na Facebook gbala ama na-awakporo ụmụnwaayị na Enugwu
Onye na-ekwuchite ọnụ ndị uweojii n'Enugu Steeti bụ Ebere Amaraizu kwuru na ha enwetabeghị akụkọ n'ụlọọrụ ha gbasara ndị ụmụnwaanyị awakporo n'Enugu Steeti.
O kwuru na akụkọ ahụ sina tuwita gbasara mwakpo a bụ okwu asị
Amaraizu kwuru na ụlọọrụ ha dị njikere ị na-abata ozi ọ bụla gbasara nke a.
Ndị uweojii Kalifonịa akpọla aha onye wakporo ụlọọru YouTube
Ebe foto si, NASIM AGHDAM
Nasim katọọrọ YouTube n'igwe Webụsaịt ya
Ndị uweojii Kalifonịa sị na aha nwagbọghọ ahụ bụ Nasim Aghdam, onye gbara afọ iri atọ na itoolu.
Ha kwuru na iwe ya bụ na ọ YouTube na-ehichapụ ihe onyonyo ya, nke mere na-ebelata ego ọ na-enweta.
Chọpụta uru Ojị bara n'ala Igbo ebe a:Ị ma uru ọjị bara n'ala Igbo?
Ebe foto si, Nwabueze Nwonwu
'Onye wetara ọjị wetara ndụ'
N'akụkọ egwuregwu
Ray Wilkins nwụrụ dịka ọgbara afọ iri isii na otu
Onye gbara mba England n'akwa otu Chelsea bọọlụ bụ Ray Wilkins anwụọla taa mgbe ọgbara afọ iri isii na otu.
Wilkins gbakwara ndị Manchester United, AC Milan, Rangers na QPR bọọlụ.
Ndị ezinaụlọ ya kelere ndị enyi maka izibata ozi obiọma ha.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile