Ogunewe nọchiri anya Imo steeti n'ụlọ omeiwu nta anwụọla

Ọgbakọ omeiwu na Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Independence Ogunewe bụ onye nnọchite anya ndị Ahịazụ Ezinihite Kọnstituensi na ọgbakọ nke isii

Nwafọ Igbo bụbu onye omeiwu nke agba nke isii bụ Hon. Independence Ogunewe anwụọla.

Ogunewe bụ onye nnọchite anya ndị Ahiazu Ezinihite Fedralụ konstituensi n'ụlọ omeiwu nta.

Achọpụtara na nwaamadị a nwụrụ n'ụlọ ya n'Abuja mgbe ekwentị ya kụgidere azaghị aza.

Ka ọ dị ugbua, ozu ya nọ n'ụlọozu dị n'ụlọọgwụ gọọmenti etiti dị n'Abuja.

A mụrụ Ogunewe na 1960 mere o ji dị afọ iri ise na asaa (57) tupu ọ nwụọ.

Independence Ogunewe nke bụ onye Mbaise n'Imo steeti nọchitere anya ndị be ha n'ụlọomeiwu nta ugboro abụọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a