Okwu mwakpo ndị ọchịehi a ga-ebi ebi?

Ọtụtụ ehi na-agagharị n'Enugu
Nkọwa foto,

Ọtụtụ ehi na-agagharị n'ime obodo Enugu

Mwakpo na na-ebo ndị ọchị-ehi na obodo Ọkpankụ nke dị n'Aniri, Enugwu Steeti na mkpu ndị Ụmụọwa Ibu nị n'Imo Steeti na eti maka etu ndị ọchi-ehi jị awakpo ma tọọrọ ụmụaka ha bụpụtekwara okwu banyere mpamkpa a na-ebo ndị ọchị-ehi na ebe dị icheiche na Naịjirịa ọzọ.

N'Ọkpankụ, akụkọ na-akọwa na ndịuweoji na-akasị ụmụokorobia ndị obodo ahụ obi na rịo ha nwe ndịdị gbasara okwu mere na be ha ebe ndị ọchịehi gara n'ime ebe obibi otu onye okaiwu.

A sị na ha malitere ị ghọrọ mango n'ebe ahụ ma bekasia onye nche nọ ebe ahụ ahụ mgbe ọ bidoro ị bara ha mba maka mangoha na aghọrọ.

Ebe ndị ụmụowa ibu n'Imo steeti na-ata ahụhụ maka na ha enweghị ike ị ga ọrụ ugbo chọta ihe oriri ha ga-eji chekwa onwe ha makak egwu ndị ahụ.

Nsogbu ọzọ na-enye ndị umuowa ibu bụ ntọrọ a na-atọ ụmụaka ha chere naọbụ ndị ọchịehi ahụ na-eme.

Okwu a ebeghị sọsọ na mpaghara ọwụwa anywanwu ka ọ na akpọtu ebe ndị steetị dị icheiche na-enwe kwa otu nsogbu a.

Ọ metụtara obodo dị icheiche dịka Benue, Zamfara, Kogi, Ekiti, Edo na Plateau n'ọnwa ole n'ole gara aga.

Eserese a na-egosi obodo ebe nsogbu a pụtara ihe:

Aha onyonyo,

Mmachị ọchị ehi

Gọọmentị Naịjiria kwuru na ha na-agbanị ị hụ na nsogbu a ga-ebi n'oge adịghị anya. Ha na ndịagha Naijiria gbakọrọ aka ị bido atụmatụ a kpọrọ 'ọsọ nwa mba' n'obodo Taraba, Benue n'Adamawa.

Unyaahụ kwa ka ha dụpụrụ ndị agha pụrụiche sị ha ga ba obodo Zamfara nchekwa ma mmadụ ma udo na gburu gburu obodo ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Akara ntụ-ntụ