Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Ha na-enyocha ma mmadụ 30 enwere ịba Lasa n'Ụmụahia
Akụkọ ndị kachasị mkpa n'utụtụ a
Ụlọọgwụ FMC na-enyocha ma mmadụ ịrị atọ enwere iba Lasa
Ebe foto si, AFP
Ụlọọgwụ Federal Medical Centre n'Umuahia ekwuola na ha na-enyocha ma mmadụ 30 enwere ịba Lasa.
Ha kwuru na ha nwere nkpebi a maka dokinta Chizorom Ndukwu bụbụ onye na-arụ ọrụ na ụlọọgwụ FMC ịba lassa gburu.
Ha kwuru na ugbua, ndị okachamara na ihe gbasara ọrịa a abiaala Ụmụahia maka ịhụ na ọrịa agbasaghị.
Egbuola ndị uwe ojii abụọ na Kogi
Ebe foto si, Getty Images
Ndị oji egbe egbuola ndị uweojii abụọ ma merụọ otu nwoke ahụ na n'ụlọorụ ha na Gegu n'ime Kogi steeti.
Onye na ahụ maka mgbasa ozị gbasara ndị uweojii na steeti ahụ bụ Williams Ayah kwuru na ha zuru ọtụtụ egbe na mgbọ.
O kwukwara na ọchịchị gbara maka latrik adighi nke nyere ha ohere ikpa ika a akpalu.
Otu nwaanyị egbuola onwe ya ma merụọ mmadụ atọ ahu na Califonia
Ebe foto si, TWITTER/@ERINJEANC/VIA REUTERS
Otu nwanyị agbaala egbe wee merụọ mmadụ atọ ahụ tupu o gbuo onwe ya n'ụlọọrụ ihe onyonyo nke akpọrọ Youtube n'obodo California.
Ndị uweojii sị na enyi nwoke nwaanyị a so na ndị merụrụ ahụ.
N'egwuregwu
Ebe foto si, EPA
Real Madrid emeriri Juventus n'asọmpị Champions League agbaara ụnyahụ.
Ha nyere ha ọkpụ atọ na asaghị otu.
Mana goolu "Bicycle kick" goolu Ronaldo nyere bụ ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na eti mkpu n'elu igwe okwu social media
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile