Abia Steeti: Anyị na-agba mbọ ịlekọta ndị ihe a mere

Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015 Image copyright @okezieikpeazu
Nkenke aha onyonyo Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Akwa daara n'Umuahia mgbe ebubatara ozu ụmụnwanyị abụọ na ndị ọzọ merụrụ ahụ bụ ndị ọrụ nwunye Gọvanọ Abia Steeti nwere ihe mberede okporoụzọ.

Ihe mberede a mere n'uzọ Ururuka dị nso na Ndịolumbe nke ọchịchị obodo Isiala Ngwa Saụt, mgbe ụgbọala ha sọgharịrị isi ọtụtụ oge.

Ndị nwụrụ gụnyere Nwamaka Maduchukwu bụ onye ndụmọdụ nwunye Gọvanọ na mgbasa ozi na Promise Nwamkpa onye dị ya bụbu onye omeiwu nke Abia Steeti.

Nwunye Gọvanọ bụ Nkechi Ikpeazu wepụtara ozi site n'ọnụ onye ode akwụkwọ ya na mgbasa ozi Eze Ajuzie.

O kwuru na ọ bụ ihe nwute na ụdị ihe a mere ndị ọrụ ya, rụọ Chineke ka ọkasịe ezinaụlọ ndị nwụrụ anwụ na ndị merụrụ ahụ obi.

Nkechi kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na ndị merụrụ ahụ na-atara ọgwụgwọ tara ọchịchị.

Mgbe BBC Igbo gbara onye Kọmishịọna mgbasa ozi nke Abia Steeti bụ John Okeiyi ajụjụ ọnụ, o kwuru na nke a bụ eziokwu.

O kwukwara na ọ gaarala ezinaụlọ ndị ahụ mgbaru, kwuo na a na-agba mbọ ịhụ na ndị merụrụ ahụ na-atara ọgwụgwọ.

Okeiyi gwara BBC Igbo na nwunye Gọvanọ nọ na oke iri uju, na ọ gaghị enye ohere ị zaa ajụjụ ọnụ mgbe ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara