Sierra Leone: Maaida Bio abụrụla onyeisiala ọhụrụ

Ebe foto si, AFP
Maada Bio chịburu mba Sierra Leone dịka onye agha
Maaida Bio meriri Samura Kamara, onye pati nọ n'ọchịchị bụ All Peoples Congress (APC) na mmetọpụ ntuliaka e mere na ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Maachị.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na mba Sierra Leone bụ Mohamed Conteh, kwupụtara na Bio ji votu 1,319,406, nke pụtara pasenti 51.81 nke o nwetara n'ime 2,546,577 bụ ezi votu a tụrụ na ntuliaka were merie Kamara.
Kamara nwetara votu 1,227,171 nke pụtara pasenti 48.19 n'ime ezi votu a tụrụ.
Conte kwuru na ọ bụ mmadụ 2,578,271, nke pụtara passenti 81.11 ndị tinyere aha ha n'akwụkwọ ntuliaka sonyere na ntuliaka ahụ, ebe votu 31,694 bụ votu adabanyechaghị (invalid votes),
Conteh sị: "Site na ikike e nyere me dịka onyeisi ntuliaka site na iwu ntuliaka nke afọ 2012, ana m etinye aka n'akwụkwọ iji kwuo na dịka Bio Julius Manda nwetara votu 1,319,406 n'ime ezi votu a turu na mmetọpụ ntuliaka onyeisiala e mere n'abali iri atọ na otu nke ọnwa Maachị, na a họrọla ya dịka onyeisiala nke mba Sierra Leone.
"Onye ọbụla bụ onye Sierra Leone sonyere na ntuliaka nwere ike igbagha ntuliaka site na ide akwụkwọ mkpesa degara ụlọikpe kacha n'ala anyị tupu abalị asaa a ga, dịka iwu alanyị gbasara ntuliaka siri dị."
Maada Bio chịburu mba Sierra Leone nwa obere oge, mgbe ya na ndị agha otu ya weghara ọchịchị n'ike n'afọ 1992 ga bụ onyesisala nke ise nke Sierra leone dịka o jiri votu karịrị 92,000 merie ogbo ya onye APC.
Bio ga ewere ọchịchị n'aka Ernest Bai Koroma nke APC, onye chịzuola agba abụọ nke bụ afọ ise,afọ ise.
Ọ bụ pati iri anọ sonyere na ntuliaka nke mbụ mere na ụbọchị nke asaa nke ọnwa maachị, ebe e nweghị onye nwetara pasent 55 dịka iwu ala ha siri dị.