'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola'

Oke Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Dokịta chọrọ ka goomenti wakpo ọria Lasa dika ha si mee Ebola.

Ọrịa Lassa Fever ka na-akpa mkpamkpa na-ala anyi bu Naịjirịa

Ka ọ dị taa, ya bụ ọrịa ogbugbu a na-ebutekarị site n'ahụ oke abatala Abia Steeti n'akwa Steeti ndị ọzọ.

Otu onye ọrụ ahụike na-ahụ ka ọrịa si agbasasị bi n'Enugwu bụ Chinenye Nwaekpe Kowara ịba lasa dịka ọrịa a na-ebute site n'oke ma ọ bụ anụmanụ ndị ọzọ.

Ọdọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpuchie ebe ọbụla ha dosara nri ndị dịka garrị, akwụkwọ nri, Breadị, mmanya ndị dị n'iko makana oke ahụ na-ebu ya bụ nje lasa nwere ike ịnyụkwasa ya mamịrị.

Nke a nwere ike ibute ọrịa ịba lasa ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Otu ụzọ esi gbochi ọrịa Lassa bu n'ikpuchite ihe mmadụ na-eri eri.

Nwaekpe Kwara arịrị na ndị Dọkịnta n'akwa ndị ọru ahụike kachasị ebute ọdachị a n'ihi na ha anaghị akpachapụrụ onwe ha anya ọfụma.

Ọ rịọrọ gọọmentị ka ha were aka ahụ ha jịrị merie Ebola wee chakwasa ọrịa Lasa a ọkụ ma chụpụ ya n'ala anyị.

Chinenye Nwaekpe bụ onye ọrụ ahụike nke a na-akpọ 'Epidemologist' n'olu bekee, gwara ndị ọchịchị obodo nile ka ha kụọ ekwe wee gwa ndị mmadụ ụzọ mgbochị ọrịa bụ Lassa Fever.

Ọrịọrọ ndị ọbụla ka na erị oke ma ọ bụ anụ ọhịa ndị ọzọ ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọghọọ aka mmadụ.

Gere ihe okwuru ebe a n'uju:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Chakwasa ịba lasa ọkụ dika esi mee Ebola'
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-ekwu na ọrịa Lasa e nwebeghị ọgwụ eji agwọta ya.

Ụzọ mgbochi lasa fiva

Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere:

1.Debe gburugburu gị ọcha, ekwela ka oke bịa nso na be gị

2.Erila ihe ọbụla oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị

3.Were ihe na-egbu nje hichaa gburugburu ebe oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị

4.Onye ọbụla ahụ ọkụ na-eme, kpọrọ ya ga n'ụlọ ọgwụ

5.Kpuchi onwe oge ị na-emetu onye ahụ na-adịghị aka

6.Mara etu isi ekwe ndị mmadụ aka

7.Mechie ebe niile nwere ohere oke nwere ike isi bata n'ụlọ gị

8.Ahụ rịa gị, ga n'ụlọ ọgwụ

9.Jiri ncha na mmiri na agba agba kwọcha aka gị oge niile

Isiokwu Ndị Emetụtara