Ụlọomeiwu: Gụọnụ ndị ọchịehi ndị oyiegwu

Ndị nche obodo bu egbe Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị obodo dị na mpaghara ebe ndị ọchịehị nọ ebidola ị chekwa onwe ha

Ndị omeiwu ndị a ndị kpọrọ oku a ụnyaaahụ bụ Tọsday n'Abụja si ka gọọmenti kwụwa ndị agha na obodo niile dị na Benue steeti ebe ndị Fụlanị na-achị ehị na-awakpo, kama Ọsọ Nwamba nke bụ egwu onye gbacha ọ la.

Ndị omeiwu mmadụ anọ; John Dyeghndị, Dickson Takighir, Mr. Samuel Udende, Mark Terseer-Gbillah, ndị kwuchitere ndị ọzọ mara atụ na bido n'ụbọchị abụọ rue nke anọ ọnwa Eprel, na e gburu mmadụ iri abụọ ọhụrụ n'ebe ahụ, ebe ọtụtụ ka na-efu efu.

Ha boro ebubo na onweghị enyemaka ọ bụla si na aka ndị ọrụ nchekwa n'ebe ụfọdụ ọdachịi ndị a mere.

Ha were kpokuo gọọmenti etiti ka ọ gụọ ndị ọchịehi, "ndị oyiegwu".

Ndị omeiwu a gosiri mgbakwojuanya na a kwụsịrị Ọsọ Nwamba nke ndị agha na steeti ahụ ebe ọ na-aga n'ihu na agbataobi ha dịka na Taraba.

Na nkọwa otu n'ime ha bụ Takighir, nkwafu ọbara nke mere nsonso a mere na Ikyon na Agasha na abala atọ na abali anọ nke ọnwa Eprel; ndị ọchịehi kpara mkpamkpa na Semaka, Asom na Babanruwa na abali atọ nke ọnwa Eprel ebe ha chetara ndị obodo Udei na Umenger n'a abalị abụọ nke abụọ Eprel.

"Otu a ka o siri mee na mpaghara Sengev, Mbakyondo na Mbapa dị n'okpuru ọchịchị Gwer-West dịka ndị ọchịehi ji ngwa agha na akpa ike ebe ahụ.

"Na Tsegaase,ha gburu mmadụ abụọ, ebe otu onye na-efu na Zwatema, e gburu mmadụ abụọ na Tse Adeke, otu onye na Tse Adudu, ebe otu onye na-efu na Tsekelefu. Ka ọ dị ugbua anyị amatabeghị mmadụ ole ihe metụtara n'Enger. N'abali atọ nke ọnwa Eprel, e gburu mmadụ anọ n'Anyebe, otu onye na Mbavihi nke wardụ Tonbo dị n'okpuru ọchịchị Logo local government."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ndị omeimu ndị a kwuru na ọdachị ndịa niile mere na agbanyeghị na ndị agha na eme ọsọ Nwamba na steeti ahụ, ma ga n'ihu kwuo na ọ gbara ha gharịị na ndị agha kwụsịrị 'Ọsọ Nwamba' na-agbanyeghị gbuogbuogbuo nka na-eme ebe ahụ.

Ha kporo oku na gọọmenti ziga ndị agha na obodo ndị nsogbu a na-emetụta.

"Anyi na-akpọ gọọmenti etiti oku ka ha kọwara ndị Benue na ndịị alal Naijiria ihe mere na a kwụsịrị 'Ọsọ Nwamba' naa Benue ebe ihe na-ebe ka na-ebe.

"Anyị chọrọ ka gọọmenti ziga ndị agha na Benue dịka o kwesịrị ma nwe ebe ndị agha na-anọ na mpaghara ebe ihe ndị a na-eme were rue mgbe nsogbu ga-abịa na njedebe.

"Anyị na-akpọ gọọmenti etiti oku ka o mee ọ gụọ ndị ọchịehị 'ndị oyiegwu ozigbo n'ihi mpụ na imebi ihe ha na-eme. Ndị mba ụwa lee anya ma hụ ka ndị a si acho ikpochapụ ndị Benue."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a