Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Zuma ga-apụta ụlọikpe maka mmerụka

Akụkọ ndị kachasị n'ụtụtụ a

Ndị omeiwu chọrọ ka a gụọ ndị ochiehi 'ndị oyiegwu'

Ebe foto si, Getty Images

Ndị omeiwu ala Naịjirịa etieela mkpu ọhụrụ ma kpo oku ka gọọmentị etiti gụọ ndị ọchịehi ndị oyiegwu

N'ihi ogbugbu ọtụtụ mmadụ nke na-aga n'ihu na Benue Steeti, dịka ha na-ebo ebubo na ndị agha akwụsịrịla 'Ọsọ Nwamba' na mpaghara ahụ.

Ebe bụ isi mmiri ala Igbo?

Eze obodo Nri n'ime Anambra steeti bụ Emelie Okolie adọọla ndi Aguleri na Igboukwu aka na ntị.

Ọ sịrị ha kwụsị ịzọ na ọ bụ Aguleri maọbụ Igboukwu bụ isi mmiri Igbo. N'okwu ya, Nri bụ mbido Igbo.

O kwukwara na okwu a bụ ihe gbasara mmụọ, na ọbụghị okwu ha ga-emebi maka ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla.

Jacob Zuma ga-aga ụlọikpe maka mpu na aghọghọ taa

Ebe foto si, Getty Images

Jacob Zuma bụbu onyeisiala Saut Afrika nọkwa na nnukwu nsogbu

Ọ ga-aga ụlọikpe maka ịza ajụjụ gbasara ebubo na o zuru ego ruru ijeri dọla abụọ na ọkara bụ ego ekwesiri iji zụọ ngwa agha n'afọ 1990.

Mana Zuma ka na-ekwu na aka ya dị ocha.

N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Arsenal emeriela CSK Moscow ọkpụ anọ asatara otu

Ọbụghịkwa obeli ife

Ha meriri CSK Moscow ọkpụ anọ asatara otu

Mana Arsene Wenger kwuru ọrụ ka dị n'ihu.