Premiership: Otu di icheiche na-akwadebe agha

Ndị otyu Liverpool Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Liverpool na Everton na-azọ okwa onye kachasị oge ọbụla

Asọmpị na ngwụcha izuụka a bụ ụbọchị asaa n'ime onwa nkea ga-ahu ọtụtụ otu egwuregwu sọ mpi.

Na Premier League, Liverpool na Everton ga-asọ mpi na elekere iri abụọ na okara nke ehihe.

Christal Palace na Bournemouth, Newcastle na Leicester ga-asọmpi n'elekere atọ n'ehihe.

Stokecity na Tottenham Hotspur ga-esokwa n'oge ahụ.

Asọmpị kachasị mkpa

Mana asọmpị ha kachasị atụ anya bụ nke Man City na Man United.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ bụrụ na man City merị Man United aga eburu iko Premier League

Ha ga-asọ mpi a n'elekere isi na okara nke abalị satọde.

Otu ọkachamara n'ihe gbasara egwurugwu bụ Stephen Mbonu gwara BBC Igbo na obi ya kwuru na Man City ga-emerị n'asọmpị a.

O kwuru na: "cheta na Liverpool meri Man City n'ụbọchị abụọ garaaga. Asọmpi a bụ ụzọ ha ga-eji kpanite mmụọ ọzọ"

Man United ha dị njikere?

Mbonu kwuru na Lukaku na Pogba bụ ndị ga-enye Man United nsogbu na asọmpị a.

Image copyright Getty Images

N'okwu ọnụ Mbonu: "ọ bụrụ na Man United lee ihe onyonyo ka Liverpool sịrị merị Man City ha nwere ike ị ma Man City aka ntị n'asọmpị a"

Tottenham na Stokecity

Nkea bụ asọmpị ọzọ ndị egwuregwu na-amasị na-atụ anya.

Stoke City ga-ejii anya ọnwụ na ndụ sọ mpị a makana ha so na ndị a nwere ike ịgbapu na iko premier league.

Mana Tottenham na-agba mbọ ugbua ka ha ba otu anọ kachasị mma makana sọọsọ asọmpi premier league ka ha nọrọ ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara