Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe n'Ondo steeti

Ụmụnwaanyị dị ime Image copyright Aproko girl
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị dị ime achọghị ịkwụ ọtụtụ ụgwọ ndị ụlọọgwụ na-ana ha

Ihe ruru ụmụnwaanyị narị abụọ (200) dị ime mere ngagharị iwe n'isi obodo Akure dị n'Ondo steeti ụnyaahụ.

Iji kwuputa etu o siri jide ha n'olu, ụmụnwaanyị ndị a gara n'Ondo State Specialist Hospital mere ka gọọmentị mata na ha achọghị ịkwụ ụgwọ ọhụrụ a na-asị ha kwụọ.

Ha nọchiri ọnụụzọ ụlọọgwụ ahụ ma gbochikwa ndị bịara ịnata ọgwụgwọ ịbata n'ụlọọgwụ.

Ụmụnwaanyị a kwuru na ego a na-ana ha pụtara N25,000 maka ịmụ nwa na nkịtị nakwa N50,000 nke ịmụ nwa site n'ịwa afọ, karịrị akarị.

Akụkọ ga-amasị gị

Ụmụnwaanyị a kwuru na ha na-akwụbu N1,000 iji denye aha ha maka nyocha ahụ tupu a mụọ nwa nke bekee kpọrọ antenatal, mana ugbua ha na-akwụzị N4000.

Ha kwukwara na ebidoro ịna ha N500 ọzọ maka oge ọbụla ị bịara nyocha antenatal.

Iwe ha bụ na ha anaghị akwụbu ụgwọ iji mụọ nwa karịa N1,000 ahụ oge Olusegun Mimiko nọbu n'ọchịchị, mana ugbua o juru ha anya ụdịrị ego a na-ana ha.

Image copyright Aproko girl

Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya