Akụkọ kachasi n'abalịa: Kanụ Nwankwọ agaghị azọ ọchịchị

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa.

Njem Orji Uzor Kalu na mpaghara ọdịda anyanwụ

Image copyright Orji Uzor Kalu Facebook
Nkenke aha onyonyo Orji Uzor Kalu wụbu gọvanọ Abia steeti site n'afọ 1999 ruo 2007

Orji Uzo Kalu na Ọọnị nke Ife bụ Oba Adeyeye Enitan Ogunwusi, zukọrọ taa n'obieze ya.

Kalu mere njem a iji kwado udo n'etiti ndị Naịjirịa, o kwuru na o kwenyere n'ime ndịnotu Naịjirịa.

Njem a akpọgala ya n'obieze Alake nke Egbaland bụ Oba Adedotun Aremu Gbadebo nakwa Oba nke Lagos bụ Oba Rilwan Akiolu.

Mbugo n'ọkwa ndị agha Naịjirịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nyere iwu mbugo a maka nkwenye siri ike na ike ndịagha gosiri ka ha na-alụ ọgụ n'ọhịa Sambisa

Ndị agha Naịjirịa ebugoola ndịagha puku atọ na narị asaa na iri abụọ na itoolu (3,729) n'ọkwa.

Onyeisi na-ahụ maka mmekọrịta ndịagha na ndị mmadụ bụ Brigadier General Texas Chukwu, kwuru na ndị agha a ebugoro n'ọkwa bụ ndị otu Operashụn Lafiya Dole so lụọ agha operashụn Deep Punch nke abụọ n'ọhịa Sambisa.

Ikpe Jacob Zuma

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E boro Zuma ọtụtụ ebubo mmerụaka

Ụlọikpe amaala onye chịburu mba Saụt Afrịka bụ Jacob Zuma ikpe.

Ha mara ya ikpe maka mmerụaka n'ihe gbasara ngwaagha, mpụ na aghụghọ nakwa mbupu ego o mere n'ebe afọ 1990.

Cheta na Zuma rituru n'oche ọchịchị onyeisiala n'ọnwa Febụwarị ka ndị otu pati ya kwanyere ya ọkụ n'ike maka ebubo mmerụaka.

N'akụkọ egwuregwu

Nkenke aha onyonyo Nwankwo Kanu so na ndị ọgba bọọlụ bulirila iko Premier League, FA, Champions League, iko UEFA ma nwetakwa medaalụ ọlaedo nke Olympic

Onye gbabuuru Naịjirịa bọọlụ bụ Kanu Nwankwo, ekwuputala na ọ gaghị azọ ọchịchị na 2019.

O kwuru na ọ dịbeghị nkwadobe ịzọ ọchịchị n'oge na-adịghi anya dịka ọtụtụ ndị ntaakụkọ siri kwuo n'izu gara aga.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKedụ aha ụtọ ị na-etu onye ị hụrụ n'anya?

Isiokwu Ndị Emetụtara