Ihe a na-ekwu gbasara Aisha Wakil na 'social media'

Mama Bokoharam
Nkenke aha onyonyo Aisha Wakil kwuru na Bokoharam ga-atọghapu nwa Dapchi akpọrọ Leah Sharibu

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na Aisha Wakil bụ onye Igbo a na-alụ na Kanuri.

Isi sekpu ntị kita bụ na ọ gbara ndị Igbo gharị ka ya ndị Boko haram si akpakọrịta ụka.

Kamgbe ọ kọwachara BBC Igbo n'asụsụ Igbo ka ya na ndị oyiegwu a sị akpa, ọtụtụ ndị Igbo na-ekwu uche ha n'igwe okwu 'social media'.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparitaụka Aisha Wakil na BBC Igbo

Ufọdụ na-akatọ mkparita ụka Aisha Wakil na Boko haram ebe ụfọdụ ka na-agbagha na ọ bụghị eziokwu na ya bụ nwaanyị suru Igbo.

Lee ụfọdụ ihe ndị Igbo na-ekwu n'igwe okwu 'Facebook'.

Image copyright BBC Igbo 'facebook page'
Nkenke aha onyonyo Ọ gbagwojuru ụfọdụ anya na Aisha Wakil bụ onye Igbo

Ụfọdụ n'ime ha ekweteghị na Aisha Wakil bu onye Igbo.

Image copyright BBC Igbo 'facebook page'
Nkenke aha onyonyo Ndị a ekweteghị na Aisha bụ onye Igbo

Ọtụtụ ndị ụlọọrụ mgbasa ozi dị iche iche zisara ya bụ mkparịtaụka Aisha Wakil na BBC igbo nwere n'igwe okwu 'Social media'

Image copyright @blingxblog
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naijiria sị na ha enweghi okwu ha ga-asa Aisha Wakil
Image copyright @Emzzydnty
Nkenke aha onyonyo O bụghị taa ka Aisha Wakil bidoro kwuwe na ya na Bokoharam na-akparita ụka

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: