Akụkọ kachasi n'abalịa: Anwụchiela ọchịehi bu AK-47
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa.
Ndị Ọchịehi
Ebe foto si, Getty Images
Onye ọchịehị na ehi ya.
Ndị uweojii Enugwu anwụchiela otu onye ọchịehi bu egbe AK-47 n'obodo Ugbawka dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Nkanụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amarizu gwara BBC Igbo na ọ bụ ama agbaara ha n'otu ọrụugbo nọ ebe ahụ mere ha ji nwee ike ijide ọchịehi a.
O kwukwara na udo alọghachịtala n'obodo ahụ, na nsogbu adịghịzị.
Mwakpo ndị ohi mere n'Offa
Ebe foto si, Ayobami Agboola
Ihu otụ n'ime ụlọakụ ndị a wakporo
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Kwara steeti bụ Okasanmi Ajayi, gwara BBC na ndị ohi wakporo ọtụtụ ụlọakụ n'Offa ụbọchị Tọọsde gara aga, gburu mmadụ iri na asaa.
Ajayi kwuru "Anyị anwụchiela mmadụ asaa anyị na-enyo enyo. Anyị enwetala ụgbọala asaa na ụfọdụ ekwentị ndị ohi a ji mee mwakpo a."
O kwuru na ọbụghị mmadụ iri atọ dịka ndị ntaakụkọ siri kwuo, ma kwuokwa na ndị uweojii itoolu nke gụnyere otu nwaanyị dị ime, so na ndị nwụrụ.
Na mba ofesi
Ebe foto si, PAUL FEGMANN
Foto ndị si na social media na-egosi ka oche si tọgbọrọchaa ka ụgbọala ahụ batara ebe ndị mmadụ nọ ala
Ọtụtụ mmadụ anwụọla n'obodo Muenster dị na Germany ka otu onye nyabara ụgbọala ya n'etiti ndị ji ụkwụ aga.
Otu ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru na ihe ruru mmadụ iri atọ merụkwara ahụ n'ihe mberede a.
N'akụkọ egwuregwu
Ebe foto si, Reuters
Mohamed Salah merụrụ ahụ n'egwuregwu Liverpool na Manchester City n'asọmpi Champions League ha gbara n'izu gara aga
Asọmpi premier league dị n'etiti Everton na Liverpool gwụrụ n'enweghị onye nyere ibe ya goolu.
Nwaafọ Egypt nakwa onye egwu ndị Liverpool bụ Mohamed Salah, esoghị ha n'egwuregwu ndị agbataobi a (bekee kpọrọ ya derby) maka ahụ ọmerụrụ.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Ihe nkiri taa
Ndị Igbo kwuputara ihe ha chere bụ 'Rectangle'