Izu Afrịka na foto: Site na Maachị 30 ruo Epreelụ 5 nke 2018

Nhọpụta foto kacha mma si na mpaghara Afrịka na nke ndị Afrịka nọ ebe ndị ọzọ n'ụwa n'izu a.

Otu nwoke dina n'ala buru obe ka a na-eme ejije mkpọgide n'obe nke Jesu Kristi iji mee emume ncheta ụbọchị Good Fraide, nke bidoro emume Ista na Legọs ụbọchị Maachị 30, 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otu nwoke dina n'ala ka a na-eme ejije mkpọgide n'obe nke Jesu Kristi ụbọchị Good Fraide na Legọs, Naịjirịa...
A na-akasi otu nwaagbọghọ obi ka ọ na-ebe akwa oge a na-eme ejije mkpọgide n'obe iji cheta ụbọchị Good Fraide, nke bidoro emume Ista na Legọs ụbọchị Maachị 30, 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo A na-akasi otu nwaagbọghọ obi ka ọ na-ebe akwa oge a na-eme ejije mkpọgide n'obe a.
Ndị ofufe na-ekpe ekpere n'oge a na-eme ekpere Ista n'ụka Legio Maria African Mission dị na Kibera slum na Nairobi, Kenya n'ụbọchị mbụ nke Epreelụ, 2018. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ebe nwokoroọbịa a ji obi umeala ekpe ekpere n'isi obodo Kenya bụ Nairobi.
Harun Karanja bụ onye nwe ụlọahịa Facebook Curio, ji ekwentị ya elebanye anya na Facebook ya na mpaghara Rift Valley dị na Mai Mahiu, Kenya n'ụbọchị Maachị 28, 2018. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Harun Karanja bụ onye nwe ụlọahịa Facebook Curio, ji ekwentị ya elebanye anya na Facebook ya na mpaghara Rift Valley dị na Kenya.
Ụmụnwoke na-arụ ọrụ ebe a na ewu ụlọ n'obodo Goma, isi obodo ugwu Kivu dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke mba Democratic Republic nke Congo ụbọchị anọ nke Epreelụ 2018. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Otu nwoke na-arụ ọrụ ebe a na ewu ụlọ n'obodo Goma dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke mba Democratic Republic nke Congo...
Ụmụnwoke na-arụ ọrụ ebe a na ewu ụlọ n'obodo Goma, isi obodo ugwu Kivu dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke mba Democratic Republic nke Congo ụbọchị anọ nke Epreelụ 2018. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ n'elu osisi eji akwado ụlọ nke bekee kpọrọ scaffolding.
Ọkọlọtọ mba Saụt Afrịka na nke ndị otu pati ANC gbara foto ọcha na ojii nke Winnie Madizikela-Mandela gburugburu ebe a kwụnyere ya n'ahụaja nke Old Durban Prison's Human Rights ka ndị mba Saụt Afrịka gbakọrọ ịkwanyere onye lụrụ ọgụ megide ịkpa oke agbụrụ anya ikpeazụ n'obodo Durban n'ụbọchị abụọ nke Epreelụ, 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo N'ụbọchị Mọnde n'obodo Durban dị na mba Saụt Afrịka, ahụrụ foto Winnie Madizikela-Mandela bụ onye na-alụ ọgụ megide ịkpa oke agbụrụ, ka a na-amụrụ ya anya abalị ka ọ nwụrụ oge ọ dị afọ 81.
Ụmụnwaanyị ndị otu ANC mere ngagharị iji mee ncheta Winnie Madikizela-Mandela, wụbu nwunye onyeisiala Nelson Mandela n'obodo Soweto, Johannesburg, n'ụbọchị anọ nke Epreelụ, 2018. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ebe ụmụnwaanyị a na-agụ egwu iji kwanyere oriakụ Madikizela-Mandela ugwu n'obodo Soweto ebe o bibu nakwa ebe ọlụtara ọgụ mmegide ịkpa oke agbụrụ.
Ndị otu nche nkwanyeugwu mere ngosipụta n'ụbọchị Wenesde na nzukọ nke afọ 43 nke ndị otu Islamic Development Bank n'obodo Tunis, Tunisia n'ụbọchị anọ nke Epreelụ, 2018. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo N'obodo Tunis bụ isi obodo Tunisia, ndị otu nche nkwanyeugwu mere ngosipụta n'ụbọchị Wenesde na nzukọ nke afọ 43 nke ndị otu Islamic Development Bank.
Egwuregwu Commonwealth nke Gold Coast 2018 - emume mbido - ọgbọ egwuregwu Carrara - Gold Coast, Australia - ụbọchị anọ nke Epreelụ, 2018 - Salome Nyirarukundo bụ onye Rwanda bu ọkọlọtọ ndị mba ha n'emume mbido asọmpi. Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo N'ime otu ụbọchị ahụ n'Australia, Salome Nyirarukundo bụ onye Rwanda bu ọkọlọtọ ndị mba ha n'emume mbido asọmpi egwuregwu Commonwealth.
Ndị a na-eji egosi ejiji gosipụtara ekike Mark Johnson mere n'izu eyimeeyi nke Accra, Ghana, n'ụbọchị 31 nke Maachị, 2018. Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo N'ụbọchị Fraịde, onye a na-eji egosi ejiji gosipụtara otu ekike n'izu eyimeeyi nke Accra.
Otu nwaanyị tụnyere vootu ya n'ime akpati eji eme ntuliaka n'obodo Freetown n'ụbọchị 31 nke Maachị ka e mere ntuliaka nhọpụta onyeisiala Sierra Leone nke agba abụọ. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo N'ụbọchị Satụde, otu nwaanyị tụnyere vootu ya ka e mere ntuliaka nhọpụta onyeisiala Sierra Leone nke agba abụọ.
Ndị mmadụ nwụrịrị maka mmeri Julius Maada Bio dịka onyeisiala ọhụrụ nke Sierra Leone n'ụbọchị Epreelụ nke anọ nke 2018 n'obodo Freetown, Sierra Leone. Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ nwere aṅụrị n'obodo Freetown n'ụbọchị Wenesde ka akpọpụtara aha Julius Maada Bio dịka onye meriri.

Ndị nwe foto a bụ AFP, Reuters, EPA na Getty Images.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a