Brazil: Lula ebidola nga afọ 12 maka mmerụaka

Lula da Silva Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Lula da Silva chịrị onye zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro atọ tupu o merie chịrị mba Brazil bido n'afọ 2002 rue 2011

Lula da Silva na-ebido mkpọrọ afọ iri na abụọ atụrụ ya maka mmerụaka ka o nyefechara onwe ya n'aka ndị uweojii.

Nke a mere ka ya na ndị uweojii mechara 'onye ga-ebu ụzọ tabie anya' abalị abụọ dịka ọ gbara ọsọ ndụ gbaga n'ụlọ otu na-ekwuchitere ndị ọrụ aka na mba ahụ oge ụlọikpe nyere ya iwu ka onyefe onwe ya.

Ndị uweojii ji ụgbọala ha kwọrọ nwa amadị ahụ dị afọ iri asaa na abụọ, dịka o siri n'ụlọọrụ ahụ dị na obodo ya dị nsọ na Sao Paulo,pụta, ebe ọtụtụ ndị ihe ya na-amasị otu ya nọchiburu ụgbọ ahụ ịpụ.

Lula kwụsiri ike na ikwu na aka ya dị ọcha ma kwuo na ya na-akwanyere iwu ụlọikpe nyere ka anwụchịe ya ugwu.

A kwọrọ ya n'ụgbọelu gawa obodo Curitiba ị ga-ebido mkporo.

Ndị na-eme ngagharịiwe gbara ... dịka ụgbọelụ ahụ na-ada, ebe ndị uweojii gbara ikuku-ose iji gbasa igwe mmadụ gbakọrọ.

Ndụ ụlọọụ na agbanyụ okụ kwuru na mmadụ asatọ merụrụ ahụ, gunyere onye mgbọ rọba.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: