Nzeribe: Igbo kwesiri ịnweta steeti abụọ ọzọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Chuma Nzeribe kwuru maka mmegbu ndị Igbo
Ebe foto si, Chuma Nzeribe Facebook Page
Chuma Nzeribe nọchiteanya Ihiala Federalụ Konstituensi n' ụlọomeiwu nke nta ugboro abụọ
Onye bụbu onye nnọchịte anya Ihiala Federal Constituency na ụlọomeiwu nta bụ Chuma Nzeribe ekwụola na Steeti abụọ ndị ọzọ jiri karịa nke ndi mpaghara ọwụwaanyawu na Naịjịrịa bụ ụzọ aghụghọ e ji akpagbụ Ndigbo.
Na mkparitaụka ya na Vanguard, Nzeribe sị na o so na mmegbụ ndị kpatara akwa nnwereonwe a na-ebe n'ala Igbo.
Gov. Ganduje ekwetaghị na ụmụaka binyere aka
Ebe foto si, Kano state/twitter
Gọvanọ Ganduje gọrọ na ụmụaka soghị binye aka na ndọrọdọrọ ọchịchị emere na Kano
Gọvanọ Abdullahi Ganduje nke Kano steeti agọla na ebụbọ a na-ebo na ụmụaka erụbeghị afọ iri an asatọ mere ntụliaka nke okpụrụ ọchịchị emere na steeti ahụ.
Ganduje sịrị na onweghị ihe gọsiri na foto ahụ gosiri na ụmụaka so mee ntụliaka bụ na Kano ka ọ mere.
Cheta na INEC ka na-enyonye anya na ya bụ ebụbo.
Lula de Silva nọ na mkpọrọ afọ iri na anụọ ụgbụa
Ebe foto si, Getty Images
Onye chiburu Brazil bụ Lula Silva chọkwara ịlahachị azụ na ọchịchị tupu ụkwụ akpọ ya
Onyeisiala ndị Brazil chiburu mbụ ga amalite nga afọ iri na abụọ ụlọikpe tụrụ ya na onwa a.
Amara Lula da Silva ikpe maka mpu na angari oriri mgbe ọ nọ na-ọchichi.
Ebe foto si, PAUL ELLIS
Man U bụ ọdachị nye ndị Man City n'egwuruegwu nke Premia lig
Ndị otu egwu bọlụ Manchester United siri na azu napụ ndị Manchester City mmeri nke kara ị meha okaibe na Premier league.
Man U ji Ọkpụ 3 asatara 2 napụ ndị Man City ike.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri
Kanu Nwakwo: A ga m apụta ịzọ ọkwa onyeisiala n'onwe m