Imo State: "Ọbụghị eziokwu na-enwepụtaghị ego maka nyefe ọchịchị"- Ebere Nzewuji

Imo akwodoola maka nyefe ọchịchị

Ebere Nzewuji Image copyright Ebere Nzewuji

Gọọmenti Imo steeti, ekwuola na ha ewepụtala ego a ga-eji mee meme ịnyefe ọchịchị n'aka Ihedioha.

Onye enyemaka Gọvanọ Okorocha, Ebere Nzewuji kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka taa.

Image copyright FEC_Twitter

Anyị abata n'Abuja ebe Onyeisiala Muhammadu Buhari gbatikwuru ụbọchị ọrụ ndị Minista ya ruo ụbọchị iri abụọ na asatọọ nke ọnwa Mee a.

Ọ gwara ndị Minista ahụ ha were akwụkwọ nyefe ọchịchị ha bịawa ọgbakọ ikpeazụ nke ha ga-eme n'ime ọnwa bụ ebe ha ga-anọ chisa ọwara.

Ụlọikpe na London amaala ụmụnwanne atọ ikpe

Image copyright Getty Images

N'ofesi, ụlọikpe na mba UK amaala ụmụnwanne atọ ndị Naịjrịa ikpe maka ịnye aka bufeere ndị otu nzuzo akporo Black Axe ego ruru otu nde pound mba ofesi.

Otu n'ime ndị a amara ikpe na-agọ na ọnweghị ihe gbarasa ya na ndị otu nzuzo a, agbanyeghị na nwanne ya nwaanyị na-anụ onyeisi ndị otu a ebe ha bị na London.

Onye ntuziaka Chelsea bụ Maurizio Sarri ga-ama ọdịnihu ya nsonso

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Onye ntuziaka Chelsea bụ Maurizio Sarri

N'egwuruegwu, onye ntuziaka Chelsea bụ Maurzio Sarri ga-amata ọdịnịhu ya mgbe otu egwu bọlụ ahụ mgbe ya na ndị isi kpachara ụbụbọ.

Maurizio sị na ọ bụ mgbe ha na Arsenal gbachara asọmpị nke ikpeazụ ka ya ga-amata ma ya a ka ga-anọ ka ọ bụ ya uje.

Gee Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Buhari o mezuru nkwa ya?

Image copyright Getty Images

Dịka onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari zọtara ọkwa ọchịchị na ntụlịka afọ 2019, ajụjụ ọtụtụ dị ndị mmadụ n'ọnụ.

Otu n'ime ha bụ o mezuru nkwa ya na otu pati ya bụ APC kwere ndị Naijiria nke ha gbadọrọ ukwu were tunyere ya votu n'afọ 2015?

Kedụ ihe o merela ha, iji nata ha nkwado ọzọ na agba nke abụọ?

BBC Igbo lenyere anya n'asaa n'ime nkwa o kwere iji tulee ndị o mere na ndị o meghị:

I. Ibuso mmerụaka agha

Ihe o mere: EFCC napụtara ọtụtụ mmadụ e boro ebubo mmerụaka nnukwu ego na ụlọ mana o nwebeghị onye ụlọikpe mara ikpe maka mmerụka.

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala na nzukọ ndị isi otu APC mere ụbọchị Monde ebe ọ nọ kwupụta na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ n'afọ 2019

N'aka nke ọzọ, ndị pati ndị ọzọ na-ebo Buhari ebubo na ọ bụ sọsọ ndị esonyeghị na pati ya ka a na-anwụchi maka mmerụaka.

2. Ibuso Boko Haram agha iji nwe ezi nchekwa

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ana chosi Shekau ike na Naịjirịa ugbua.

O belatara mkpamkpa Boko Haram ma nata ha obodo ndị ha kpaara dịka nke ha.

N'aka nke ọzọ, nchekwa obodo ka na akpụ afọ n'ala n'ihi na ndị Fulani na-achị ehi egbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgbaghara dị na-etiti ha na ndị ọrụugbo.

3. Inye ọrụ dị 720,000 kwa afọ

Ihe o mere: Kama inye ọrụ dịka Buhari siri kwe na nkwa ma rotekwara ndị mmadụ oge ọ biara na Legos nsonso, a chụrụ mmadụ ruru nde anọ n'ọrụ.

4. Imachi ndị ọrụ gọọmenti ịga mba ofesi maka ọgwụgwọ ọrịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari na Trump kpara maka ibuso ndị oyi egwu agha

Ihe o mere: Buhari amachighị ya dịka osi kwe na-nkwa, kama, ya onwe, na nwa ya nwoke bụ Yusuf gara mba ofesi maka ịnata ọgwụgwọ.

5. Otu nri n'ụbọchị maka ụmụaka Prịmarị nke gọọmentị

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị ugwụ Awụsa kachasị nwe ụmụaka anaghị aga akwụkwọ na Naịjirịa

Ihe o mere: E bidola atụmatụ a na nanị steeti iri na anọ: Anambara, Enugwu, Oyo, Osun, Ogun, Ebonyi, Zamfara, Delta, Abia, Benue, Plateau, Bauchi, Kadụna na Taraba.

Mana ụfọdụ ndị ọrụ obodo kwụụru onwe ha sị na N70.00 maka otu nri anaghị enye nri nwere isi.

6. Ịrụ mahadum nka na ụzụ isii

Image copyright Getty Images

Ihe o mere: A rụbeghị ọbụladi otu.

7. Ime ọkụ latrik ka ọ gbalite rue 20,000 megawat n'afọ anọ

Nke a bụ maka iji mee ka ọkụ na-adị mgbe niile.

Ihe o mere: Dịka Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ bụ Babatiunde Fashola siri kwuo, Naijiria enwetarula 7000 megawat.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: