Ipob: Mpụtagharị Buhari ga-enye anyị Biafra

Onweghị onye nụrụla olu onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu kamgbe ọnwa Seputemba, afọ 2017. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onweghị onye nụrụla olu onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu kamgbe ọnwa Seputemba, afọ 2017.

N'ụbọchị taa, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwupụtala obi ya ị zọ ọkwa ọchịchị ọzọ n'afọ 2019.

Nkwupụta ya butere ọtụtụ ọsịịsa site n'ọnụ ndị mmadụ dị icheiche, ụfọdụ bụ ndị katọọrọ ya dịka ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ihe o kwesiri i mee.

Mgbe BBC Igbo gbara Ụkọchukwu Innocent Chukwudi Peace bụ onyeisi mgbasa ozi otu chọrọ nwereonwe na Naịjirịa bụ Ipob ngalaba dị n'Abuja ajụjụ ọnụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

O kwuru na ọ bụ ihe ọṅụ nye ndị Ipob n'ihi na Chineke ji ọchịchị Buhari e mee ka nwereonwe Biafra bịa na mmezu.

O kwuru na ọ bụrụ onye ọzọ na-akpọghị ndị Igbo asị dịka Buhari bara n'ọchịchị, onye ahụ nwereike i mee ka obi daa jụọ ndị Igbo nke ga-eme ka ndị Igbo chefuo na ha bụ ohu na Naịjirịa.

Peace kwuru "Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na "Pharoah" ahụ ga-anọ n'ọchịchị gaa n'ihu, dịka Obasanjo kwuru na Naịjirịa ga-ekewa ma ọ bụrụ na Buhari baa n'ọchịchị."

"Ekpere anyị n'ụtụtụ, ihihie na abalị bụ ka Naịjirịa gbasa sịa" Peace kwuru.

Gere okwu ụkọchukwu Peace ebe a;

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤkọchuku Peace: Chịneke ga-eji Buhari wetara anyị Biafra