Ọgbaghara obidola na Ohaneze ọzọ?

Ohaneze ndị Igbo na Naịjirịa
Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017

Ndị kọmitii Ohaneze ndị Igbo hibere maka itinye anya n'okwu na-esi n'etiti ndị isi, ụmụntorobịa na otu ụmụnwaanyị ha ekwuola na ọ bụ nndị isi oge ka kwụrụ chọrọ ka e tinyekwuoro ha oge n'oge ọchịchị ha bụ aka enwe dị n'ofe dịka o siri gbasara nsogbu otu ahụ na-enwe ugbua.

Nke a so n'ihe pụtara na nchopụta ha nwere nsonso a.

Na mkparịtaụka ya na BBC Odeeakwụkwọ kọmitii ahụ bụ Okpani Nkama kwuru na ọ bụ ntuliaka ndị ogbo(Youth Wing) na-erute bụ ihe bụtere anwụrụọkụ ahụ na-akwụ.

Ọ gara n'ihụ kọwa na ndị ọchịchị ogbo ntorobia na nke ụmụnwaanyị a ekwesirilarị ịrịda na-ochịchị dịka iwu Ohaneze siri kwuo.

"Mana ihe ọgụ na mgba na ebubo niile a ị na ahụ bụ ka ka agbara ị ya bụ ntụliaka na ọgụ mgbụrụ ụbọchị nke Epurelụ."

Cheta n'abalị ole na ole gara aga, onyeisi ndị otu ogbo nke Ohaneze bụ Okechukwu Isiguzoro zigara ndị ntaakụkọ akwụkwọ ebe ha naọ kwuọ na ha na achụtu onyeisi Ọhanaeze n'ihi ihe ha kpọrọ "ọchịchị aka ike".

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a