Ipob nabatara Buhari 2019
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ihe Ipob kwuru maka mpụtaghrị Buhari na 2019
Ebe foto si, Getty Images
Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ
Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Rev. Chukwudi Peace sịrị na ya bụ ebụm n'ọbị Onyeisiala bụ ihe obi ụtọ nyere ha.
Okwụrụ na Biafra ga abịa nkwankwa ma ọbụrụ na Buharị chịrị gawa.
Na ọbụrụ na onye ọzọ chịwa, ihe dị mma, Igbo nwere ike ị da mba ọzọ.
Ihe kọmiti ọkpe udo Ọhaneze chọpụtara
Nnia Nwodo Onyeisi Ohaneze ndị Igbo sịrị na nsogbụ ụfọdụ ụmụnorobịa bụ nkata ezianụlọ
Kọmitii Ohaneze ndị Igbo hibere maka ị lebe anya na-ọgbaghara na-ada n'otu ahụ a ekwuola na ọ bụ ndị isi ndị ntorobia na nke ụmụnwaayị oge ha zụgoro bụ ihe malitere ọgbaaghara na otu ahụ.
Ode akwụkwụ kọmitii ahụ bụ Nze ọkpani Nkama kwuru nke a na mkparita ụka ya na BBC.
Ohaneze ndị Igbo ga amalite ntụliaka ndị ntorobia nakwa nke ụmụnwaanyị ha na ọgụ ụbọchị nke Ọnwa bụ Epurelu.
Ihe Russia kwuru maka ogbunigwe agbara na syria
Ebe foto si, Getty Images
Agbara ihe a na-eche na ọ bụ ogbunigwe nuklea na Douma, ọdịda anyanwụ Ghouta nke Syria ụbọchị satọde
Mba Russia ekwuola na ogbunigwe ahu atụrụ na Saria ụbọchị satụde bụ ogbuigwe nke nuklea.
Minista Russia na ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Sergie Lavrov sị na onweghị ihe gosiri na ihe agbara ebe ahụ bụ ogbunigwe nke nuklea.
Naịjirịa eritala otu ọla ọcha na egwuruegwu nke kọmọnwelt
Ebe foto si, Getty Images
Ndị egwuruegwu 37 na ndị isi 4 ka Naịjirịa dugara egwuruegwu kọmọnwelt
N'egwuruegwu, Naịjirịa enwetala otu ọla ọcha na egwuruegwu Commonwealth nke a na-eme na mba Australia.
Mba India jị ọkpụ atọ were ọla edọ etinyere na egwuruegwu tenis.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri
Chioma Akpotha: Ugwu ka e jiri mara nwaanyị Afrịka