Akụkọ kachasị taa: Anambra steeti sozi na ndị na-eme mmanụ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Anambara steeti esonyela steeti ndị na-emepụta mmanụ.

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka obodo ndị na-emepụta mmanụ na Naịjirịa bụ Prince Mike Emuh kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị eze Anambara steeti okwu ụnyaahụ.

Onyeisiala mba Sierra Leone na-ele anya n'ọgbaaghara ndị na-akwado ya butere

Image copyright Reuters

Onyeisiala ọhụrụ nke mba Sierra Leone bụ Julius Maada Bio eguzobela otu ga-enyocha ebubo ọgbaghara n'etiti ndị na-akwado ya na ndị na-akwado onye ya na ya zọrọ ọchịchị bụ Samura Kamara.

Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị na akwado Kamara ọkachasị ụmụnwaanyị na ụmụaka hapụrụ ụlọ ha maka agha ndị na-akwadọ Bio busoro ha.

Ndị ọrụ n'ọdọ ụgbọelu na Jamini na-agba abụbọ ọrụ

Image copyright Getty Images

Njem ụgboelu na mba Germany ga-akpụ afọ n'ala taa ebe ndị ọrụ ha chọrọ ịgba abụbọ ọrụ.

Ụgbọelụ Lufthansa kagbru ọtụtụ njem ha kwesiri ime taa maka na ndị na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu ha ajụla na ha agaghị arụzi ọrụ.

Na egwuregwu, Naịjirịa eritela olaedo atọ n'asompi egwuregwu Commonwealth

Image copyright Getty Images

Esther Oyema, Ndidi Nwosu na Roland Ezuruike eritala ọlaedo site na-ibu ihe nke ngalaba ndị ọlụsị.

Ihe nrite Naịjirịa nwetarela ruru asaa nke gụnyere sịlịva anọ na ọlaedo atọ.

Nkeji nke ụtụtụ a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo taa

Ụmụ Naịjirịa ekwupụala uche ha gbasara nkwupụa onyeisiala Buhari na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'afọ 2019.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNtuliaka 2019: Ndị mmadụ ekwuola obi ha gbasara Buhari

Akụkọ ndị ga-amasị gị