Mitchell: Ọ bụrụ maka ntụlịaka, ọ gaghị enwe isi

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnyeisioche otu na-ahụ maka obodo ndị na-emepụta mmanụ na Naịjirịa sị na Anambra Steeti so

Onyeisioche otu na-ahụ maka obodo ndị na-emepụta mmanụ na Naịjirịa nke a kpọrọ, 'Host Communities Producing Oil and Gas, HOSCON, bụ Prince Mike Emuh kwupụtara nke a n'ọgbakọ ndị eze nwere n'Awka, Anambra steeti unyaahụ.

N'okwu ya, Emuh kwuru na gọọmenti etiti etinyela aka n'akwụkwọ banyere ịrụ ụlọọrụ na-esi mmanụ agbịdị iri na steeti iri na otu a na-egwupụta mmanụ.

O gara n'ihu kwuo na a ga-arụ otu n'ime ụlọọrụ ahụ na-esi mmanụ agbịdị na Anambara steeti.

O kwukwara na gọọmenti etiti ga-ewepụta ohere ọrụ 10,000, na steeti ndị na-egwupụta mmanụ nke ndị ntorobịa Anambara ga-enweta ọrụ dị 1,000 n'ime ha.

Obi Ọnịcha bụ Igwe Alfred Achebe kelere ya ma kwuo na ndị eze ọdịnaala ga-ewepụta kọmiti nke eze Aguleri, Igwe Christopher Idigo, nọ n'isi ya iji lebenye anya n'ebe a ga-amapụta maka iwu ụlọrụ ne-esi mmanụ agbidi ahụ yana etu a ga-esi họta ndị ntorobịa a ga-enye ọrụ.

Na-agbanyeghị, ndị ọrụ anyị gakwara n'ihụ kpọtụrụ ndị Anambra Steeti ụfọdụ ọnụ n'erụ na-okwu uche ha maka akụkọ a.

Onye mbụ anyị kpọtụrụ bụ ọdeakwụkwọ gọọmenti steeti ahụ bụ Solomon Chukwulobelu.

Chukwulobelu sị na ka ọdị mgbe ahụ na ya agaghị asawu okwu obula maka ya bụ akụkọ maka na ya anọghị na ụlọọrụ mgbe ahụ.

Okwere nkwa na ya ga gwa anyi nke bụ eziokwu n'izuuka ọzọ mgbe ya naruru.

Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti

Asịsa Mitchell n'ihe Mike Emuh kwuru

Onye ọzo anyị kpọtụrụ bụ Mitchelle Onugbolu nke bụ onye ndụmọdụ pụrụiche maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na gọọmentị Willie Obianọ.

Odoziakụ Onụgbolụ sị na ya bụ okwu ga abụ ihe magburu onwe ya ma ọbụrụ na ọ bịa na mmezụ.

Okwuru na ọ teele aka atụwara anya ka gọọmenti etiti kpọ ya bụ okwụ aha.

Mana ọ kara ị da ụda ma ọbụrụ na ya bụ okwụ sị n'ọnụ gọọmenti etiti dapụta.

Mgbe ajụrụ ya ka ọchere na ọ bụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 ka eji pụta kwụọ ọkwụ a.

Akụkọ ga-amasị gị: