Ọ bụ olu onye nkuzi anyị ka ndị mmadụ nụrụ n'ekwentị - OAU

Ụmụakwụkwọ OAU Image copyright OAU Facebook
Nkenke aha onyonyo OAU bụ ụlọakwukwọ mahadum na-ewu ewu maka ezi mmuta

Ọnụ na-ekwuchitere ndị mahadum Obafemi Awolowo dị n'Ile-Ife bụ Abiodun Olanrewaju, ekwuola na olu a nụrụ n'igwe okwu ekwentị bụ nke onyenkuzi ha n'eziokwu.

Cheta na otu mkparịtaụka dị n'etiti onye nkuzi ndị OAU na nwata akwụkwọ ọ nọ na-enye nsogbu ka o dina ya tupu o mee ọfụma n'ule, bidoro iwu na soshal midia n'ime izu a.

Ka Olanrewaju na onye ntaakụkọ BBC bụ Lawrence Pollard kwuru n'ekwentị, o kwuru na ha amatala onye nkuzi ahụ kwuru okwu n'ekwentị ahụ.

O kwukwara na ndị na-achịkọta OAU ahọpụtala kọmitee ga-etinye anya n'ihe mere, ma chọpụta ndị ihe a gbasara.

O kwuru "ndị isi mahadum agbaala ya ajụjụ (query) nke ha ga-esi n'ime ya mata ihe ọzọ ha ga-eme."

Olanrewaju kwuru na ha chọrọ ka "ụmụakwụkwọ ụdịrị ihe a metụtara pụta, ma kwuputa ma enwee onye nkuzi na-enye ha nsogbu."

Ihe mere

N'ime mkparịtaụka ha, nwata akwụkwọ nwaanyị ahụ jụbụrụ, gara n'ihu gwa onye nkuzi ya na ya ekwetela n'okwu ya.

Okwu dagharịrị oge onye nkuzi ahụ gwara ya na ọ ga-edina ya ugboro ise tupu o mezuo nkwa ime ka ọ gafee n'ule.

Ihe Olanrewaju gwaburu BBC

"Anyị egeela mkparitaụka ahụ na-efegharị. "Anyị na-enyocha iji mara na ndị a nụrụ olu ha na mkparịtaụka ahụ n'igwe okwu bụ ndị si ụlọakwụkwọ anyị.

"OAU anaghị eji nti anụ ihe gbasara mmekpaahụ metụtara mmekọrịta nwoke na nwaanyị."

"Amaghị onye nkuzi ahụ n'ihi na odoghị anya ngalaba ebe ọ na-akụzi."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a