London: ụmụ ntorobia itoolu anwụọla

Ogbugbu London
Nkenke aha onyonyo Nwa ịkpe azụ nwụrụ n'ogbugbu a

Nke a bụ mbụ n'ime ọnwa anọ a na-egbu ndị isi ojii dị iri ise, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ntoroọbịa site n'egbe ma ọ bụ na nma n'ime obodo Lọndọn.

N'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Maachị (25 3-18), otu onye akpọrọ Abraham Badru gbara afọm iri abụọ na isii (25), nwa onye omeiwu Naịjirịa bụ Dolapu Badru nwụrụ n'aka nne ya n'ihu ụlọ ha dị na Hackney, Uk.

Dịka ndị akụkọ kwuru, e ji egbe gbagbuo ya, mana ndị uweojii ahụbeghị onye gburu ya.

Orughị izuụka abụọ nke a mere, n'abalị anọ nke ọnwa Epụrelụ, nwa afọ Naịjirịa ọzọ akpọrọ Isreal Ogunsola dị afọ iri na asatọ (18) nwụọ site na nma amara ya n'ahụ.

Ndị uweojii ejidela otu nwata dị afọ iri na asaa (17) maka igbu mmadụ, ebe ha ka na-achọ onye ọzọ.

Akụkọ ka nkụ gbasara ụmụ afọ Naịjirịa nwụrụla na Lọndọn.

Ihe karịrị ikpe dị itoolu, ebe ikpe karịrị iri na asatọ dị n'aka ndị uweojii enweghị ezigbo akụkọ.

Lee ndị nwụrụ kemgbe mbido afọ 2019:

Oluwadamilola Odeyingbo, 18

Taofeek Lamidi, 20

Harry Uzoka, 25

Rotimi Oshinbajo, 26

Fola Odubiyi, 18

Niyi Shode, 24

Kelvin Odunuyi, 19

Abraham Badru, 26

Israel Ogunsola, 18

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Otu onye bi na London a kpọrọ Maazị Kelechi Isiodu gwara BBC Igbo n'ekwenti na ihe nke a bụ ihe nwute.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụ ntorobia ruru itoolu Naijiria nwuru na London

Abike Dabiri-Erewa na-agwa ndị Naịjiria bi London ha tee nkwucha, ọ degara ụlọọrụ ndị mba Britain akwụkwọ sị ha mee nyocha zuruoke.

Onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ Kayode Ogundamisi bị kwa na London gwara BBC Igbo na ihe gọọmentị Naịjiria na-eme ezụghị.

Ọ sị "ụlọọrụ mba ndị isi ojii ndị ọzọ dị na London jisike na-enwe nzụkọ ka ha mara etu a ga-esi nyere ezinaụlọ ndị ahụ aka mana ọ nweghị ihe Naijiria na-eme"

Ogundamisi sị na ọ bụ oke ubịam na e dunye ụmụaka n'ụdị ndụ a ị bido rewe ọgwụ ike maọbụ banye otu ọjọọ dị icheiche.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara