Ndị uweojii egosila egbe ndị Imo Steeti wepụtara
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Lee ihe Kingsley Moghalu kwuru maka Buhari ịputa ọzọ
Ebe foto si, Kingsley Moghalu
Kingsley Moghalu bụ onye okaiwu bụrụkwa osoteonyeisi nke ụlọakụ kacha elụ na Naịjirịa n'afọ 2009 - 2014.
Nwafọ Igbo bụ Prof. Kingsley Moghalu nke na-achọ ịpụta ịzọ ọchịchị onyeisiala ekwuola uche ya maka nkwupụta onyeisiala Buhari.
Moghalụ kwuru na ihe ejiri mara onyeisiala Buhari bụ ụbịam na enweghị nchekwa. Ọ sịrị na ya ga-eme karịa.
Ndị uweojii n'Imo steeti egosila egbe ha napụtara n'Imo Steeti
Ebe foto si, NPF
Ndị uweojii bidoro inapụta egbe na Naịjirịa na 21 Feb. 2018
Onyeisi ndị ụweojii n'Imo steeti bụ Chris Ejike ekpopụtala egbe ndị mmadụ wepụtara na mmezu ị dọ aka na ntị ha nyere.
Ejike gosiri ọha egbe dị otu narị na iri isii na asatọ (168) na mmgbọ karịrị puku abụọ n'Owerri na ụtụtụ a.
Lee ihe ekwuru maka mmadụ itoolu ndị Naịjirịa egburu na London
Ebe foto si, Getty Images
Egbuola ihe ruru mmadụ iri ise nke itolu n'ime ha bụ ndị Naịjirịa na Lọndọn kemgbe jenuwari
Abike Dabiri-Erewa bụ oje ozị onyeisiala Buharị na mba ọzọ rịọrọ arịrịọ a ma degara ndị gọọmentị mba Lọndọn akwụkwọ.
Ọ gwara ha ka ha tinye anya na nyocha mmadụ itoolu ndị Naịjiria so na ndị egburu n'obodo ahụ.
Onye Afrịka ọzọ eritela ọla edo n'egwuruegwu Commonwealth
Ebe foto si, Getty Images
Ndị egwuruegwu 37 na ndị isi 4 ka Naịjirịa dugara egwuruegwu kọmọnwelt
N'egwuruegwu, nwafọ Botswana bụ Isaac Makwala esorola na ndị ritere ọlaedo n'egwuruegwu commonwealth.
Oritere ya bụ ọlaedo na ọsọ nke mita narị anọ ha gbara.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
'Ikpe ikpe gawa godu'