Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392

Edgal Imohimi Image copyright @rrslagos
Nkenke aha onyonyo Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu

Kọmishọna ndị uweojii na Legos bụ Edgal Imohimi kwuru na e nwere ijiegbeezu 1315, mwakpo ndị otu nzuzo 359, nakwa ntọ 392 na steeti ahụ n'afọ anọ.

Imohimi, onye kwupụtara nke a na ọgbakọ nchekwa nke Legos steeti nke e mere na Legos kwuru na a nwụchiri ọtụtụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome, ebe ikpe ha ikpe ka na-aga n'ihu.

O kwuru na ndị uwe ojii belatara ike ndị otu nzuzo a kpọrọ 'badoo,' akpa na mpaghara Ikorodu nakwa ndị isiekewọnwụ n'obodo dị na ikpere mmiri na steeti.

O kwuru na ọ bụ nkwado ngwa ọrụ sitere na enyemaka nke gọọmentị Legos steeti mere ka ndị uwe ojii nwelie ike ime nke a.

O kwukwara site na enyemaka ndị nchekwa obodo na njikọaka o hibere kemgbe ọ malitere ọrụ na steeti ahụ.

Ọ kpọrọ oku ka agawanye n'ihu inwe ọrụ nchekwa gbanyere ụkwụ na nchọpụta nakwa enyemaka ndị eze ọdịnala nakwwa ọzụzụ ndị ọrụ nchekwa ka ọrụ ha were na-aga siririwerere.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a